Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 31:48 - Bible Nso

48 Leban we si, Obo a bu ihe-àmà n'etiti mu na gi ta. N'ihi nka akpọrọ aha-ya Galeed:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

48 Emesịa, Leban sịrị, “Ka nkume ndị a bụrụ ihe ama nʼetiti mụ na gị taa.” Nke a mere e ji kpọọ ya Galeed.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 31:48
10 Iomraidhean Croise  

Ọ we si, Umu-nne-aturu asa ndia ka i gānara n'akam, ka ọ we ghọrọm ihe-àmà na m'gwuru olùlù-miri a.


Ọ we chiri umu-nne-ya tiyere onwe-ya, nāchu ya ije nke ubọchi asa, we chukuru ya n'ugwu Gilead.


Site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, na obodo ahu nke di na ndagwurugwu ahu, we rue Gilead, ọ dighi obodo nke kariri ayi elu: ihe nile ka Jehova, bú Chineke-ayi, rara nye n'iru ayi:


M'we nye ndi Reuben nye kwa ndi Gad site na Gilead we rue ndagwurugwu Anon, bú etiti ndagwurugwu ahu, ka ọ buru ókè-ala; we rue miri-iyi Jabok, bú ókè-ala umu Amon;


kama ihe-àmà ka ọ gābu n'etiti ayi na unu, na n'etiti ọb͕ọ nile nke umu-ayi ndi gānọchi ayi, ka ayi we were àjà-nsure-ọku nile ayi, were kwa àjà nile ayi, were kwa àjà-udo nile ayi, fè òfùfè Jehova n'iru Ya; ka umu-unu we ghara isi umu-ayi n'ọdi-n'iru, Unu enweghi òkè nime Jehova.


Ayi we si, O gēru kwa, mb͕e ha gāsi ayi, si kwa ọb͕ọ nile nke umu-ayi n'ọdi-n'iru, otú a, na ayi gāsi, Lenu ihe-atù nke ebe-ichu-àjà Jehova, nke nna-ayi-hà mere, ọ bughi isure àjà-nsure-ọku, ọ bughi kwa ichu àjà: kama ihe-àmà ka ọ bu n'etiti ayi na unu.


Umu Reuben na umu Gad we kpọsa okwu bayere ebe-ichu-àjà ahu, N'ihi na, ka ha kwuru, ihe-àmà ka ọ bu n'etiti ayi, na Jehova bu Chineke.


Joshua we si ndi Israel nile, Le, nkume a gābu àmà megide ayi; n'ihi na ọ nuwo okwu-ọnu nile nke Jehova nke Ọ gwara ayi: ọ gābu kwa àmà megide unu, ka unu we ghara igọnari Chineke-unu.


Mb͕e ọ nwusiri, Jaia, bú onye Gilead, we bilie; ọ kpe Israel ikpe orú arọ na abua.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan