Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 31:46 - Bible Nso

46 Jekob we si umu-nne-ya, Chikọtanu nkume; ha we were nkume me obo: ha we rie nri n'ebe ahu n'akuku obo ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

46 Jekọb gwakwara ndị so ya sị ha, “Tụtụkọta nkume.” Ha tụtụkọtara nkume wụsa ha nʼotu ebe mee ka ọ laa elu. Emesịa, ha nọdụrụ nʼakụkụ nkume ndị ahụ rie nri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 31:46
11 Iomraidhean Croise  

Ọ we chiri umu-nne-ya tiyere onwe-ya, nāchu ya ije nke ubọchi asa, we chukuru ya n'ugwu Gilead.


Onye ọ bula i gāchọta chi-gi-hà n'aka-ya, ọ gaghi-adi ndu: n'iru umu-nne-ayi mata ihe nke gi di n'akam, were n'onwe-gi. N'ihi na Jekob amaghi na Rechel zuru ha-ri ori.


Ọ bu ezie na i bituwo ihem nile aka, ma gini ka i chotaworo nime ihe nile nke ulo-gi? Tọb͕ọ ya ebe a n'iru umu-nnem na umu-nne-gi, ka ha we kpezie n'etiti ayi abua.


Jekob we were nkume, guzo ya ka ọ buru ogidi.


Leban we kpọ ya Jega-sahaduta: ma Jekob kpọrọ ya Galeed.


Jekob we chua àjà n'ugwu ahu kpọ umu-nne-ya ka ha rie nri: ha we rie nri, nọ ọnọdu-abali n'ugwu ahu.


Ha we were Absalom, tubà ya n'olùlù uku n'oké ọhia ahu, me ka oké obo uku nke nkume guzo n'elu ya: Israel nile we b͕alaga, onye ọ bula n'ulo-ikwū-ya


mb͕e itufu nkume, na mb͕e itukọba nkume; mb͕e ib͕aku, na mb͕e inọrọ nb͕aku n'ebe di anya;


Ha we guzo n'elu ya oké obo nkume, rue ta; Jehova we si n'idi-ọku nke iwe-Ya chigharia. N'ihi ya akpọrọ aha ebe ahu, Ndagwurugwu Ekoa, rue ta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan