45 Jekob we were nkume, guzo ya ka ọ buru ogidi.
45 Ya mere, Jekọb weere otu nkume guzo ya ọtọ dịka ogidi.
Jekob we si umu-nne-ya, Chikọtanu nkume; ha we were nkume me obo: ha we rie nri n'ebe ahu n'akuku obo ahu.
Jekob we guzo ogidi ọtọ n'ebe ahu ebe Ọ kpayere ya uka, bú ogidi nkume: ọ wusi àjà-ihe-ọṅuṅu n'elu ya, wusa kwa manu n'elu ya.
Joshua we de okwu ndia n'akwukwọ iwu Chineke; o we were nkume uku, me ka o guzo ọtọ n'ebe ahu n'okpuru osisi oak ahu nke di n'ebe nsọ Jehova.
Joshua we si ndi Israel nile, Le, nkume a gābu àmà megide ayi; n'ihi na ọ nuwo okwu-ọnu nile nke Jehova nke Ọ gwara ayi: ọ gābu kwa àmà megide unu, ka unu we ghara igọnari Chineke-unu.