Ihe-àmà ka obo a bu, ihe-àmà ka ogidi a bu kwa, na mu onwem agaghi-agabiga obo a jekuru gi ma-oli, na gi onwe-gi agaghi-agabiga kwa obo a na ogidi a biakutem ma-ọli, ime ihe ọjọ.
O gēru kwa, mb͕e ọtutu ihe ọjọ na ahuhu gāchọta ha, na abù a gāb͕a àmà n'iru ha dika ihe-àmà; n'ihi na agaghi-echezọ ya pua n'ọnu nkpuru-ha: n'ihi na amawom ncheputa-ha nke ndi ahu nēme ta, tutu Mu eme ka ha ba n'ala ahu nke M'ṅuru iyi inye ha.
kama ihe-àmà ka ọ gābu n'etiti ayi na unu, na n'etiti ọb͕ọ nile nke umu-ayi ndi gānọchi ayi, ka ayi we were àjà-nsure-ọku nile ayi, were kwa àjà nile ayi, were kwa àjà-udo nile ayi, fè òfùfè Jehova n'iru Ya; ka umu-unu we ghara isi umu-ayi n'ọdi-n'iru, Unu enweghi òkè nime Jehova.