Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 31:30 - Bible Nso

30 Ma ub͕u a, i lawo n'ezie, n'ihi na agu ulo nna-gi gusiri gi ike, ma n'ìhi gini ka i zuworo chim-hà?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

30 Ugbu a, ị na-ala nʼihi na ọ gụrụ gị agụụ ịlaghachi nʼụlọ nna gị, ma gịnị mere i ji zuru chi m?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 31:30
17 Iomraidhean Croise  

Ma Leban jere ikpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya: Rechel we zue teraphim nke nna-ya nwere n'ori.


Jekob we za, si Leban, N'ihi na aturum egwu: n'ihi na asirim, Ka i we ghara inapum umu-gi ndinyom n'ike.


Jekob we si ulo-ya, ọ si kwa ndi nile ya na ha bi, Wezuganu chi nile nke ndi ala ọzọ nke di n'etiti unu, menu onwe-unu ka unu di ọcha, b͕anwe-kwa-nu uwe-unu:


Ha we rapu arusi nile ha n'ebe ahu, Devid na ndikom-ya we chiri ha.


M'gāgabiga kwa n'ala Ijipt n'abali ahu, tib͕u nwa ọ bula eburu uzọ mu n'ala Ijipt, ma madu ma anumanu; ọ bu kwa n'aru chi nile nke Ijipt ka M'gēme ihe nile ekpere n'ikpe: Mu onwem bu Jehova.


ha etiyewo kwa chi nile ha n'ọku: n'ihi na ọ bughi chi ka ha bu, kama ha bu ọlu aka madu, bú osisi na nkume; ha we me ka ha la n'iyì.


Otú a ka unu gāsi ha, Chi nile nke nēmeghi elu-igwe na uwa, ha gāla n'iyì pua n'uwa na n'okpuru elu-igwe, bú chi ndia.


M'gēsuye kwa ọku n'olu nile nke chi nile nke Ijipt; o gēsure kwa ha ọku, dọta ha n'agha: ọ gēji kwa ala Ijipt kpuchie onwe-ya dika onye-ọzùzù-aturu si eji uwe-ya kpuchie onwe-ya; o gēsi kwa n'ebe ahu pua n'udo.


N'ihi na eze Babilon guzoro n'ab͕ata uzọ, n'isi uzọ abua ahu, iju ase: o feghariri àkú-ya nile, jua ase n'aka terafim-ya, lekwasi imeju anya.


Ọ we si ya, M'gaghi-eje; kama alam na umu-nnam ka m'gālakuru.


mb͕e ndi Ijipt nēlì ndi Jehova tib͕uru n'etiti ha, bú ndi nile eburu uzọ mu: ọ bu kwa n'aru ndi bu chi-ha ka Jehova mere ihe nile O kpere n'ikpe.


Joshua we si ndi Israel nile, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, N'ofè Osimiri ahu ka nna-unu-hà biri site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, bú Tira, nna Abraham, na nna Nehoa: ha we fè chi ọzọ di iche iche.


Ndikom ise ahu, bú ndi nējeri iledo ala ahu, we rigo, ba n'ebe ahu, chiri arusi ahu apiri api, na ephod ahu, na teraphim ahu, na arusi ahu awuru awu: ma onye-nchu-àjà ahu nēguzo n'oghere ọnu-uzọ-ama, ya na nnù ndikom na ọgu iri ahu ndi ekere ihe-agha.


Ọ si, Ọ bu chim nke m'mere ka unu chiriworo, ha na onye-nchu-àjàm, unu we la, ma gini ka m'nwere ọzọ? gini bu kwa nka nke unu nāsim, Gini nēme gi?


Joash we si ndi nile nke guzoro megide ya, Unu onwe-unu, ùnu gēkpere Beal ọnu-ya? ma-ọbu unu onwe-unu, ùnu gāzọputa ya? Onye nke gēkpere ya ọnu-ya, ka eme ka ọ nwua: rapu ya rue ututu; ọ buru na chi ka ọ bu, ya kpere onwe-ya ọnu-ya, n'ihi na akwatuwo ebe-ichu-àjà-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan