Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 31:27 - Bible Nso

27 N'ìhi gini ka i b͕ala-gara na nzuzo, we ghọb͕uem? ọ̀ bụ kwa n'ihi gini ka i nēgosighm, ka m'we were ọṅù, were kwa abù, were kwa egwú-otiti, were kwa ubọ-akwara, zilaga gi?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Gịnị mere i ji ghọgbuo m, zoro ezo gbapụ? Gịnị mere ị gwaghị m ka m jiri ọṅụ na ịbụ abụ nke ya na ịkpọ ụbọ akwara na iti ịgba so, zilaga gị?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 31:27
11 Iomraidhean Croise  

Leban we si Jekob, Gini bu ihe i mere, na i ghọb͕uwom, dupu kwa umum ndinyom dika ndinyom eji mma-agha dọta n'agha?


Jekob we za, si Leban, N'ihi na aturum egwu: n'ihi na asirim, Ka i we ghara inapum umu-gi ndinyom n'ike.


Aha nwa-nne-ya nwoke bu Jubal: onye ahu bu nna ndi nile nākpọ ubọ-akwara, nēb͕u kwa ọ̀jà.


Miriam, bú nwayi-amuma, bú nwa-nne-nwayi Eron, we were egwú-otiti n'aka-ya; ndinyom nile we chiri egwú-otiti na ite-egwú soro ya pua.


Ubọ-akwara na une na egwú-otiti na ọ̀jà na manya-vine di kwa n'ọṅuṅu-manya-vine-ha nile: ma ha adighi-elegide ọlu Jehova anya, ha ahughi kwa ihe aka-Ya abua nēme.


Gideon we chiri ndikom iri sitere na ndi-orù-ya, o me dika Jehova gwara ya okwu: o rue, n'ihi na ọ turu egwu ulo nna-ya na ndikom obodo-ya, ime ya n'ehihie, na o mere ya n'abali.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan