Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 31:24 - Bible Nso

24 Chineke we biakute Leban onye Siria nime nrọ abali, si ya, Lezie onwe-gi anya ka i ghara ikpayere Jekob uka, ma-ọbu nke di nma ma-ọbu nke jọrọ njọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Ma Chineke bịakwutere Leban onye Aram na nrọ nʼabalị sị ya, “Kpachapụ anya gị, hụ na o nweghị ihe ị gwara Jekọb, maọbụ okwu dị mma, maọbụ nke dị njọ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 31:24
28 Iomraidhean Croise  

Ma Chineke biakutere Abimelek na nrọ nke abali, si ya, Le, gi bu onye nwuru anwu, n'ihi nwayi ahu nke i kuruworo; n'ihi na nwayi ahu bu nwunye di luru.


Chineke we si ya nime nrọ ahu, Mu onwem kwa, amawom na ọ bu n'izu-okè nke obi-gi ka i meworo nka, Mu onwem we b͕ochi kwa gi ka i ghara ime-hie megidem: n'ihi ya ekweghm i metu ya aka.


Leban na Betuel we za, si, N'aka Jehova ka okwu a siteworo: ayi apughi igwa gi ihe ọjọ ma-ọbu ezi ihe.


Aisak we zipu Jekob: ọ je Padan-eram, jekuru Leban, nwa Betuel onye Siria, bú nwa-nne-nwoke Rebeka, nne Jekob na Isọ.


O rue, na mb͕e ìgwè ewu na aturu turu ime, na ewelirim anyam abua, hu nime nrọ, ma, le, nkpi nile nke nāb͕a ìgwè ewu dere ọcha, tu kwa agwa, tu kwa akika.


Mọ-ozi nke Chineke we sim nime nrọ ahu, Jekob; m'we si, Lekwam.


Ọ we chiri umu-nne-ya tiyere onwe-ya, nāchu ya ije nke ubọchi asa, we chukuru ya n'ugwu Gilead.


Leban we rue Jekob aru. Ma Jekob marari ulo-ikwū-ya n'ugwu ahu: Leban na umu-nne-ya makwara ulo-ikwū-ha n'ugwu Gilead.


Ọ diri ike akam imejọ unu: ma Chineke nke nna-unu gwaram okwu n'abali nyahuru, si, Lezie onwe-gi anya ka i ghara ikpayere Jekob uka, ma-ọbu nke di nma ma-ọbu nke jọrọ njọ.


Ọ buru na Chineke nke nnam, bú Chineke nke Abraham, na Oké Egwù nke Aisak, anọghi n'akukum, n'ezie ub͕u a n'aka efu ka i gēzilagawomri. Nweda-n'alam na ndọb͕u m'ji akam abua nādọb͕u onwem n'ọlu ka Chineke huworo, Ọ̀ we bara gi nba n'abali nyahuru.


Ma nna-unu akwawom emò, we b͕anwe ugwọ-olum ub͕ò iri; ma Chineke ekweghi ya mejọm.


Ha we rọ nrọ, ha abua, onye ọ bula ọ rọ nrọ-ya n'otù abali ahu, onye ọ bula dika akukọ-isi nrọ-ya si di, bú obu-ihe-ọṅuṅu na osi-ite eze Ijipt nwere, ndi nọ n'ab͕u n'ulo-nkpọrọ.


O rue, n'ọgwugwu ogologo arọ abua, na Fero nārọ nrọ: ma, le, o nēguzo n'akuku osimiri Nail.


Ma Absalom agwaghi Amnon okwu ọ bula ma ọ bu nke di njọ ma-ọbu nke di nma: n'ihi na Absalom kpọrọ Amnon asì. n'ihi na ọ wedara Tema nwa-nne-ya n'ala.


Na Gibeon ka Jehova mere ka Solomon hu Ya anya na nrọ nke abali: Chineke we si, Riọ ihe M'gēnye gi.


Anu-aru-ya gādi ọhu kari nke nwata Ọ nālaghachiru ubọchi okorọbia-ya:


N'ihi na i nākpali onwe-gi imegidem, na n'ihi na npako-gi arigowo ba na ntim abua, M'gētiye kwa nb͕a-aka-imim n'imi-gi, na bridle nkem n'eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua, me ka i laghachi n'uzọ ahu nke i siri bia.


Jekob we b͕alaga n'ọhia Efraim, Israel we fè òfùfè n'ihi nwunye, ọ bu kwa n'ihi nwunye ka o debere aturu.


Ọ we si Biko, nurunu okwum nile: ọ buru na onye-amuma di n'etiti unù, n'ọhu ka Mu, bú Jehova, gēme ka ọ maram, na nrọ ka M'gāgwa ya okwu.


Chineke we biakute Belam n'abali, si ya, Ọ buru na ọ bu ikpọ gi ka ndikom ahu biara, gi bilie, soro ha je; ma nání okwu nke M'nāgwa gi, nke ahu ka i gēme.


Mọ-ozi nke Jehova we gabiga ọzọ, guzo n'ebe di nkpa, ebe uzọ nādighi madu gēwezuga onwe-ya ga n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe.


Ọ buru na Belak enyem ojuju ulo-ya nke ọla-ọcha na ọla-edo, apughm igabiga okwu-ọnu Jehova, ime ezi ihe ma-ọbu ihe ọjọ site n'obi nke akam, ihe nke Jehova gēkwu, nke ahu ka m'gēkwu?


Ma mb͕e ihe ndia di ya n'obi, le, mọ-ozi nke Chineke were onwe-ya gosi ya na nrọ, si, Josef, nwa Devid, atula egwu ikuru nwunye-gi Meri: n'ihi na Ihe Nke ọ di ime Ya sitere n'aka Mọ Nsọ.


Ebe Chineke duru ha ọdú na nrọ ka ha ghara ilaghachi jekuru Herod, ha we wezuga onwe-ha ga ala-ha site n'uzọ ọzọ.


Mb͕e ọ nọkwasiri n'oche-ikpé, nwunye-ya zigara ya, si, Aka-gi adila n'okwu Onye ezi omume ahu: n'ihi na ahujurum ọtutu ihe anya na nrọ ta n'ihi Ya.


I gāza kwa, si n'iru Jehova, bú Chineke-gi, Onye Siria nke nāla n'iyì ka nnam bu, o we rida n'Ijipt, nọ dika ọbìa n'ebe ahu, ya na ndikom ole-na-ole; o we ghọ mba n'ebe ahu, nke di uku, di kwa ike, ba kwa uba:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan