O rue, na mb͕e ìgwè ewu na aturu turu ime, na ewelirim anyam abua, hu nime nrọ, ma, le, nkpi nile nke nāb͕a ìgwè ewu dere ọcha, tu kwa agwa, tu kwa akika.
Mb͕e ahu ka i gākpọ òkù, Jehova gāza kwa; i gētiku Ya, Ọ gāsi kwa, Lekwam. Ọ buru na i si n'etiti gi wezuga yoke ahu, na nsetipu nkpisi-aka, na ikwu ajọ ihe;