Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 31:10 - Bible Nso

10 O rue, na mb͕e ìgwè ewu na aturu turu ime, na ewelirim anyam abua, hu nime nrọ, ma, le, nkpi nile nke nāb͕a ìgwè ewu dere ọcha, tu kwa agwa, tu kwa akika.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 “Nʼoge ụmụ anụ ụlọ ji atụ ime, eweliri m anya hụ na nrọ na ụmụ mkpi niile na-agba igwe nne ewu bụ ụmụ mkpi ndị tụrụ agwa agwa, ndị nwere akara maọbụ ndị nwere ntụpọ ọcha nʼahụ ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 31:10
11 Iomraidhean Croise  

Chineke we si ya nime nrọ ahu, Mu onwem kwa, amawom na ọ bu n'izu-okè nke obi-gi ka i meworo nka, Mu onwem we b͕ochi kwa gi ka i ghara ime-hie megidem: n'ihi ya ekweghm i metu ya aka.


Ọ rọ nrọ, ma, le, ubube nke eguzoro n'ala, ma elu-ya nēmetu ebe elu-igwe di: ma, le, ndi-mọ-ozi Chineke nārigo nārida na ya.


Ìgwè ewu na aturu ahu we turu ime n'iru nkpa-n'aka ahu, ìgwè ewu na aturu ahu we mua umu dere ọcha, na nke turu agwa, na nke turu ntupọ.


Mọ-ozi nke Chineke we sim nime nrọ ahu, Jekob; m'we si, Lekwam.


Ọ si, Biko, welie anya-gi abua, hu, nkpi nile nke nāb͕a ìgwè ewu dere ọcha, tu kwa agwa, tu kwa akika: n'ihi na ahuwom ihe nile Leban nēme gi.


Chineke we biakute Leban onye Siria nime nrọ abali, si ya, Lezie onwe-gi anya ka i ghara ikpayere Jekob uka, ma-ọbu nke di nma ma-ọbu nke jọrọ njọ.


Chineke we napu anu-ulo nna-unu, nyem.


Josef we rọ nrọ, gosi ya umu-nne-ya: ha we kpọ ya asì ọzọ kari.


Na Gibeon ka Jehova mere ka Solomon hu Ya anya na nrọ nke abali: Chineke we si, Riọ ihe M'gēnye gi.


Ọ we si Biko, nurunu okwum nile: ọ buru na onye-amuma di n'etiti unù, n'ọhu ka Mu, bú Jehova, gēme ka ọ maram, na nrọ ka M'gāgwa ya okwu.


Mb͕e onye-amuma ma-ọbu ọrọ-nrọ gēbili n'etiti gi, nye gi ihe-iriba-ama ma-ọbu ihe-ebube,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan