Serai we si Abram, Biko, le, Jehova eb͕ochiwom imu nwa; biko, bakuru nwayi nējerem ozi; eleghi anya agēsite na ya wuliem elu dika ulo. Abram we ge nti n'olu Serai.
Ma umu-ndikom nke iko-ndinyom nke Abraham nwere, Abraham nyere ha onyinye di iche iche; o we si n'ebe Aisak nwa-ya nọ zilaga ha n'Iru-anyanwu, rue ala Iru-anyanwu, mb͕e ọ nọ ndu.
Otú a ka Jehova siri, Le, M'nēme ka ihe ọjọ si n'ulo-gi bilie imegide i, M'gāchiri kwa ndinyom-i n'anya-gi nye ibe-gi, ọ gēso kwa ndinyom-i dina n'anya anyanwu a.