Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 30:33 - Bible Nso

33 Ezi omumem gāza-kwa-ram n'ọdi-n'iru, mb͕e i gābia bayere ugwọ-ọlum nke di n'iru gi: nke ọ bula nke nātughi agwa na ntupọ n'etiti ewu, nkem nke nādighi kwa nji n'etiti aturu nkem, ihe ezuru ori ka nke ahu bu n'akam.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

33 Ezi omume m ga-azara nʼọdịnihu, mgbe ọbụla ị bịara nyochaa ụgwọ ọrụ ị kwụrụ m. Ewu ọbụla na-atụghị agwa agwa, maọbụ atụrụ ọbụla na-ejighị oji ị chọpụtara nʼetiti igwe ewu na atụrụ nke m ka a ga-agụ dị ka ihe e zuru nʼohi.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 30:33
8 Iomraidhean Croise  

M'gāgabiga n'etiti ìgwè ewu na aturu-gi nile taa, si n'ebe ahu wezuga aturu ọ bula turu agwa na ntupọ, na aturu ọ bula di nji n'etiti aturu, na nke turu ntupọ na agwa n'etiti ewu: ọ gābu ugwọ-ọlum.


Leban we si, Le, biko, ya di ka okwu-gi si di.


Ọ bu ezie na i bituwo ihem nile aka, ma gini ka i chotaworo nime ihe nile nke ulo-gi? Tọb͕ọ ya ebe a n'iru umu-nnem na umu-nne-gi, ka ha we kpezie n'etiti ayi abua.


Jehova nēnyeghachim dika ezi ọmumem si di: Dika idi-ọcha akam abua si di, otú a ka Ọ nēmeghachim ọzọ.


Ọ gēme kwa ka ezi omume-gi puta dika ìhè, Ikpé-gi kwa dika etiti-ehihie.


O gēru kwa, mb͕e nwa-gi gāju gi n'ọdi-n'iru, si, Gini bu nka? na i gāsi ya, Ike nke aka ka Jehova jiri me ka ayi si n'Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta:


N'ihi na njehie-ayi bara uba n'iru Gi, nmehie nile nke ayi azawo kwa megide ayi: n'ihi na ayi na njehie nile ayi nọkọ n'otù; ọzọ, ajọ omume nile ayi, ayi mara ha:


Jehova gēnyeghachi kwa nwoke ọ bula ezi omume-ya na ikwesi-ntukwasi-obi-ya: ebe Jehova nyeworo gi n'akam ta, ma ekweghm iseti akam imegide onye Jehova etere manu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan