Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 30:30 - Bible Nso

30 N'ihi na nwanti ka ihe i nwere bu tutu mu abia, ma ọ basawo rue ọtutu; Jehova agọziwo kwa gi n'ije-ukwum: ma ub͕u a òle mb͕e ka mu onwem gēme-kwa-ra ulom?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

30 Nʼihi na ole na ole ka i nwere mgbe m bịara, ma ugbu a, ha abaala ụba nke ukwuu. Onyenwe anyị esitela nʼụkwụ m gọzie gị. Ugbu a, kedụ mgbe m ga-arụkwanụ ọrụ nke mụ onwe m maka ezinaụlọ m?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 30:30
7 Iomraidhean Croise  

Ọ si ya, Gi onwe-gi amawo òfùfè m'fèworo gi, na ihe anu-ulo-gi ghọworo n'akam.


Ọ si, Gini ka m'gēnye gi? Jekob we si, I gaghi-enyem ihe ọ bula: ọ buru na i gēmerem ihe a, m'gāzù ìgwè ewu na aturu-gi ọzọ, debe kwa ya.


Nwoke ahu we basa nke-uku nke-uku, ọ we nwe ìgwè ewu na aturu ri nne, na ndinyom nēje ozi, na orù-ndikom, na camel na inyinya-ibu di ọtutu.


mb͕e ichọ achọ, na mb͕e ime ka ihe la n'iyì; mb͕e idebe edebe, na mb͕e itufu etufu;


Le, nka bu ub͕ò nke-atọ m'nọ dika onye edoziworo ibiakute unu; m'gaghi-abu kwa ibu arọ́: n'ihi na achọghi m ihe-unu, kama ọ bu unu onwe-unu: n'ihi na ọ bughi ọlu umu ikpadoro ndi muru ha ihe, kama ọ bu ọlu ndi muru umu ikpadoro umu-ha.


N'ihi na ala ahu, ebe gi onwe-gi nābà nime inweta ya, ọ bughi dika ala Ijipt ka ọ bu, ebe unu si puta, ebe i nāgha nkpuru-gi, were ukwu-gi nāb͕a ya miri, dika akwukwọ nri ubi ab͕ara ogige:


Ma ọ buru na onye ọ bula ebughi uzọ chère ndi nke aka ya ihe nākpa ha, ma nke kachasi ndi èzí-na-ulo nke aka ya, ọ gọnariwo okwukwe-ayi, jọkari kwa onye nēkweghi ekwe na njọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan