Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 30:25 - Bible Nso

25 O rue, mb͕e Rechel musiri Josef, Jekob siri Leban, Zilagam, ka m'we la n'ebem, na n'alam.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 Mgbe Rechel mụsịrị Josef, Jekọb jekwuru Leban sị ya, “Zilaga m ka m laghachi nʼebe m na ala nke m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 30:25
13 Iomraidhean Croise  

Jehova we la, mb͕e Ọ gwabisiri Abraham okwu: Abraham we lata n'ọnọdu-ya.


Ha we rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ya onwe-ya na ndi ya na ha yikọrọ bia, ha we nọ ọnọdu-abali; ha we bilie n'ututu, ọ si, Zilagam na nke onye-nwem.


Ọ si ha, Unu eb͕ochilam, ebe Jehova meworo ka uzọm ga nke-ọma; zilagam ka m'lakuru onye-nwem.


nọ dika ọbìa n'ala nka, M'gānọye-kwa-ra gi, gọzie gi; n'ihi na gi na nkpuru-gi ka M'gēnye ala ndia nile, M'gēme kwa ka iyi ahu guzosie ike, bú nke M'ṅuru Abraham nna-gi;


Ma, le, Jehova nēguzo n'elu ya, si, Mu onwem bu Jehova, Chineke nke Abraham nna-gi, na Chineke nke Aisak' ala nke gi onwe-gi nēdina n'elu ya, gi ka M'gēnye ya, nye kwa nkpuru-gi;


Ma, le, Mu onwem nọyere gi, M'gēdebe kwa gi n'ebe ọ bula i nēje, M'gēme kwa ka i lata n'ala nka; n'ihi na M'gaghi-arapu gi, rue mb͕e m'gēmewori ihe M'gwaworo gi okwu bayere ya.


Mu onwem bu Chineke nke Betel, ebe i tere ogidi manu, ebe i kwerem nkwa: ub͕u a bilie, si n'ala nka pua, laghachi n'ala nke ọmumu-gi.


Leban we bilie n'isi-ututu, sutu umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom ọnu nke-uku, gọzie ha: Leban we la, laghachi n'ebe nke ya.


Okwukwe ka o ji biri dika ọbìa n'ala nke ekwere ya-ri na nkwa, dika ala nābughi nke aka ya, ebe o biri n'ulo-ikwū, ya na Aisak na Jekob, ndi soro ya nēketakọ otù nkwa ahu:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan