Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 30:20 - Bible Nso

20 Lia we si, Chineke enyewom ezi onyinye; mb͕e a dim gēbiyerem, n'ihi na amuworom ya umu-ndikom isi: ọ we kpọ aha-ya Zebulun.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Ugbu a Lịa kwuru sị, “Chineke enyela m ezi onyinye dị oke ọnụ. Ugbu a, di m ga-eji nkwanye ugwu leta m nʼihi na amụọrala m ya ụmụ ndị ikom isii.” Ọ kpọrọ aha ya Zebụlọn.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 30:20
15 Iomraidhean Croise  

Ọ turu ime ọzọ, mua-nwoke; ọ we si, Ub͕u a na mb͕e a ka dim gārapara n'arum, n'ihi na amuworom ya umu-ndikom atọ: n'ihi nka ka akpọrọ aha-ya Livai.


Ọ we si ya, Ọ̀bu okwu ntà na i narawo dim? ì gānara kwa mandrake nwam? Rechel we si, N'ihi nka gi na ya gēdina n'abali a n'ihi mandrake nwa-gi.


Lia we turu ime ọzọ, muara Jekob nwa-nwoke nke-isi.


Emesia ọ mu-kwa-ra nwa-nwayi, kpọ aha-ya Daina.


Me ka ọ ba uba nke-uku n'isim, bú ego-ilu-nwunye na onyinye, m'gēnye dika unu gāsim, ma nyenum nwa-ab͕ọghọ ahu na nwunye.


umu-ndikom Lia; Reuben, bú ọkpara Jekob, na Simeon, na Livai, na Juda, na Isaka, na Zebulun:


Umu-ndikom Zebulun: Sered, na Ilon, na Jahleel.


Zebulun, n'ọnu-miri nke oké osimiri ka o gēbi: Ya onwe-ya gānọ kwa n'ọnu-miri nke ub͕o. Akuku-ya gādi kwa n'akuku Zaidon.


N'ebe ahu ka ọ nọ, bú Benjamin di ntà, nke nwere ike n'aru ha, Ya na ndi-isi Juda na ìgwè ndi-ha, Na ndi-isi Zebulum, na ndi-isi Naftali.


Ọ buru na nna-ya ajusi ike iwere ya nye ya, ọ gākwu ego dika ego ọlulu umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke si di.


O we rapu Nazaret, bia biri na Kapanaum, nke di n'usọ osimiri, n'ókè-ala Zebulun na Naftali:


ndia gēguzo kwa n'ugwu Ibal bayere nkọcha; Reuben, na Gad, na Asha, na Zebulun, na Dan, na Naftali.


Berak we kpọkọta Zebulun na Naftali rue Kedesh; o we were ukwu-ya rigo, ya na orú nnù ndikom na nnù ise: Debora we soro ya rigo.


Ndi nkpọrọgwu-ha di nime Amalek siri n'Efraim rida; Nēso gi n'azu, Benjamin, n'etiti umu-nna-gi. Ndi-ònyé-ukpuru siri na Makia rida, Ndi ji nka-n'aka ode-akwukwọ ese ihe si-kwa-ra na Zebulun rida.


Sọl we si, Otú a ka unu gāsi Devid, Ọ dighi ego-ilu-nwunye gātọ eze utọ, kama ọgu api ise nke ndi Filistia, ka o we bọrọ onwe-ya ọ́bọ̀ n'aru ndi-iro eze. Ma Sọl chère ime ka Devid da ada n'aka ndi Filistia.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan