17 Chineke we ge Lia nti, ọ we turu ime, muara Jekob nwa-nwoke nke-ise.
17 Chineke nụrụ olu Lịa, ọ tụụrụ ime mụtara Jekọb nwa nwoke nke ise.
Jekob we si n'ọhia bata n'anyasi, Lia we pua izute ya, si, Mu ka i gābakute; n'ihi na achiriwom mandrake nwam gota gi n'ezie. Ọ we dinayere ya n'abali ahu,
Lia we si, Chineke enyewom ugwo-ọlum, n'ihi na enyerem dim nwayi nējerem ozi' o we kpọ aha-ya Isaka.
Ma Chineke chetara Rechel, Chineke we ge ya nti, meghe àkpà-nwa-ya.
Rechel we si, Chineke ekpeputawom, ọzọ kwa, ọ nuwo olum, we nyem nwa-nwoke: n'ihi nka ka ọ kpọrọ aha-ya Dan.
Jehova we si, Ahuwom n'ezie nweda-n'ala nke ndim nke di n'Ijipt, anuwokwam iti-nkpu-ha n'ihi ndi nāchi ha n'ihe-ike; n'ihi na amawom ihe-nb͕u-ha nile;
Ma mọ-ozi ahu siri ya, Atula egwu, Zakaraias: n'ihi na a nuwo aririọ-gi, nwunye-gi Elizabet gāmu-kwa-ra gi nwa-nwoke, i gākpọ kwa aha-ya Jọn.
O rue, n'ọb͕ub͕a arọ, na Hana turu ime, mua nwa-nwoke; o we kpọ aha-ya Samuel, si, N'ihi na ọ bu n'aka Jehova ka m'riọworo ya.