10 Zilpa, bú nwayi nējere Lia ozi, we muara Jekob nwa-nwoke.
10 Zilpa, odibo nwanyị Lịa, mụtara Jekọb nwa nwoke.
Lia we si, Enwerem isi-ọma! ọ we kpọ aha-ya Gad.
Mb͕e Lia huru na ọ kwusiri imu nwa, ọ were Zilpa, bú nwayi nējere ya ozi, nye Jekob na nwunye.
umu-ndikom Zilpa, bú nwani nējere Lia, ozi; Gad na Asha: ndia bu umu-ndikom Jekob, nke amuru nye ya na Padan-eram.
N'akuku ókè-ala Zebulun, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Gad, otù òkè.
Nke umu Gad, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;
Ma umu Reuben na umu Gad nwere ọtutu anu-ulo, ha riri nne nke-uku: ha we hu ala Jeza, na ala Gilead, ma, le, ebe ahu bu ebe anu-ulo;