2 Nwayi we si agwọ ahu, Ayi nēri nkpuru osisi nile nke ubi a ab͕ara ogige:
2 Nwanyị ahụ zara sị ya, “Anyị nwere ike rie mkpụrụ si nʼosisi niile dị nʼogige a
Jehova, bú Chineke, we nye madu ahu iwu, si, Nkpuru nke sitere n'osisi nile ọ bula nke ubi a ab͕ara ogige ka i ganēri eri:
ma nkpuru nke sitere n'osisi ima ezi ihe na ihe ọjọ, gi erila nkpuru sitere na ya: n'ihi na n'ubọchi i gēri nkpuru sitere na ya i ghaghi inwu anwu.
ma nkpuru nke osisi ahu nke di n'etiti ubi a ab͕ara ogige, Chineke asiwo, Unu erila nkpuru sitere na ya, unu emetukwala ya aka, ka unu we ghara inwu anwu.
Edide ha nwere yiri edide agwọ: Ha di ka aju-ala nke nti chiri nke nākpọchi nti-ya;