Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 3:18 - Bible Nso

18 o bu kwa ogwu na uke ka ọ gēpuru gi; i gēri kwa ihe-ọkukú nke ubi;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Ọ ga-erupụtara gị ogwu na uke, ị ga-erikwa ahịhịa nke ubi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 3:18
20 Iomraidhean Croise  

Adam ka Ọ sikwara, N'ihi na i gewo nti n'olu nwunye-gi, i we rie nkpuru sitere n'osisi ahu, nke M'nyere gi iwu bayere ya, si, Gi erila nkpuru sitere na ya: ihe anābu ọnu ka ala bu n'ihi gi; n'ihe-nb͕u ka i gēri ihe sitere na ya ubọchi nile nke ndu-gi;


n'ọsusọ iru-gi ka i gēri nri, rue mb͕e i gālata n'ala; n'ihi na esiri na ya weputa gi; n'ihi na ájá ka i bu, ọ bu kwa ájá ka i gālata.


o si, Ọtọ ka m'b͕ara si n'afọ nnem puta, ọtọ ka m'gāb͕a kwa laghachi n'ebe ahu: Jehova nyere, Jehova anarawo kwa; ka aha Jehova buru ihe agọziri agọzi.


Ka ọhia-ogwu puta n'ọnọdu ọka wheat, Ka ahihia nēsì ísì ọjọ puta kwa n'ọnọdu ọka barley. Okwu Job agwusia.


Onye onye-agu nēripia owuwe-ihe-ubi-ya, Nēsi kwa ọbuná n'ogwu were ya, Ọnyà nēkusi ume ike inwe àkù-ha.


Gi Onye nēji ìhè kpuchi Onwe-gi dika uwe-nb͕okwasi; Onye nēseti elu-igwe dika ákwà-nkwuba:


I nēme ka madu laghachi n'ájá; I we si, Laghachinu, umu madu.


Ogwu na ib͕udu di n'uzọ onye b͕agọrọ ab͕agọ n'obi: Onye nēdebe nkpuru-obi-ya gānọ ha n'ebe di anya.


Ma, le, o púchiri n'ogwu, Akuba kpuchiri iru-ya, Akwada-kwa-ra mb͕idi nkume ya.


n'ihi ala ndim, nke ogwu n'uke nēpute nime ya, e, n'elu ulo nile nke obi-utọ n'obodo nāṅuri ọṅu-agha:


m'gēme kwa ka ọ gwusia; agaghi-akwacha vine-ya, agaghi-edozi kwa ya; ma ogwu na uke gētoputa: igwe-oji nile ka m'gēnye kwa iwu ka ha ghara izokwasi ya miri.


O gēru kwa, n'ubọchi ahu, na ebe ọ bula, nke nnù vine abua na ọgu iri di ya, nke ọnu-ahia-ha bu nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri, ọ gādiri ogwu, di-kwa-ra uke.


Agāchiri àkú, were kwa uta, bia n'ebe ahu; n'ihi na nání ogwu na uke ka ala nka nile gābu.


Ha aghawo ọka wheat, ma ogwu bu ihe-ubi ha wereworo; ha aghọwo ndi-ọria, ma ọ dighi-abara ha urù: ka ihere ihe-omume nile unu me kwa unu, sita n'iwe di ọku nke Jehova.


N'ihi na otú a ka Jehova siri ndikom Juda, si kwa Jerusalem, Lucharanu onwe-unu ubi, unu agha-kwa-la nkpuru n'etiti ogwu.


Nkpuru ọzọ we da n'elu ogwu; ogwu ahu we tolite, kpab͕ue ha.


Otù onye nwere okwukwe iri ihe nile: ma onye nādighi ike nēri nání ihe anāku n'ubi.


ma ọ buru na ọ nēweputa ogwu na uke, ọ bu ihe ajuru aju, di kwa ọbubu-ọnu nso; nke ọgwugwu-ya bu ire ya ọku.


maranu nke-ọma na Jehova, bú Chineke-unu, agaghi-anapu kwa mba ndia ala-ha ọzọ n'iru unu, kama ha gāburu unu ib͕udu na ọnyà, na utari n'akuku-aru-unu, na ogwu n'anya-unu, rue mb͕e unu gālapu n'iyì n'ezi ala nka, nke Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan