Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 29:31 - Bible Nso

31 Jehova we hu na onye anākpọ asì ka Lia bu, Ọ we meghe àkpà-nwa-ya: ma Rechel bu nwayi-àgà.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

31 Mgbe Onyenwe anyị hụrụ na Lịa bụ nwanyị a kpọrọ asị, o meghere akpanwa ya, ma Rechel bụ nwanyị aga.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 29:31
26 Iomraidhean Croise  

Ma Serai bu nwayi-àgà; ọ dighi nwa ọ nwere.


Ma Serai, bú nwunye Abram, amughi nwa nye ya: ma ọ nwere otù nwayi nējere ya ozi, bú onye Ijipt, onye aha-ya bu Hega.


N'ihi na Jehova b͕ochisiri àkpà-nwa nile nke ulo Abimelek ike, n'ihi okwu bayere Sera, bú nwunye Abraham.


Aisak we riọ Jehova aririọ n'ihi nwunye-ya, n'ihi na nwayi-àgà ka ọ bu: Jehova we kwe ka ọ riọta ihe ọ riọrọ, Rebeka, bú nwunye-ya, we turu ime.


Isọ we kpọ Jekob asì n'ihi ngọzi ahu nke nna-ya gọziri ya: Isọ we si n'obi-ya, Ubọchi iru-újú bayere nnam nābiaru nso; m'gēb͕u kwa Jekob nwa-nnem.


Ọ we bakuru kwa Rechel, ọ we hu kwa Rechel n'anya kari Lia, we nēfè òfùfè n'aka Leban arọ asa ọzọ.


Lia we turu ime, mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Reuben: n'ihi na ọ siri, N'ihi na Jehova elekwasiwo nweda-n'alam anya; n'ihi na ub͕u a dim gāhum n'anya.


Ma Chineke chetara Rechel, Chineke we ge ya nti, meghe àkpà-nwa-ya.


umu-ndikom Lia; Reuben, bú ọkpara Jekob, na Simeon, na Livai, na Juda, na Isaka, na Zebulun:


Le, ihe-nketa nke nēsi n'aka Jehova bia ka umu bu: Ugwọ-ọlu Ọ nākwu ka nkpuru nke afọ bu.


Jehova we si, Ahuwom n'ezie nweda-n'ala nke ndim nke di n'Ijipt, anuwokwam iti-nkpu-ha n'ihi ndi nāchi ha n'ihe-ike; n'ihi na amawom ihe-nb͕u-ha nile;


ma Isọ ka M'kpọworo asì, me ugwu-ya nile ka ha ghọ ebe tọḅọrọ n'efu, M'were ihe-nketa-ya nye nkita-ọhia nile nke ọzara.


Onye nāhu nna-ya ma-ọbu nne-ya n'anya kari Mu adighi-ekwesim; onye nāhu kwa nwa-ya nwoke ma-ọbu nwa-ya nwanyi n'anya kari Mu adighi-ekwesim.


Ọ dighi onye ọ bula puru ibu orù nke nna abua: n'ihi na ọ gākpọ otù onye nime ha asì, hu ibe-ya n'anya; ma ọ bughi otú a ọ gējide otù, lelìa ibe-ya anya. Unu apughi ibu orù Chineke na àkù.


Ha ejighi kwa nwa, n'ihi na Elizabet bu nwanyi-àgà, ha abua aghọwo kwa agadi.


Ọ buru na onye ọ bula abiakutem, ma ọ kpọghi nna nke ya asì, ya na nne nke ya, na nwunye nke ya, na umu nke ya, na umu-nne-ndikom nke ya, na umu-nne-ndinyom nke ya, e, ndu nke aka ya kwa, ọ pughi ibu onye nēso uzọm.


Onye nāhu ndu-ya n'anya nētufu ya; onye nākpọ kwa ndu-ya asì n'uwa nka gēdebe ya rue ndu ebighi-ebi.


O we nye ya ọb͕ub͕a-ndu nke obibì-úgwù: otú a Abraham we mua Aisak, we bì ya úgwù n'ubọchi nke-asatọ; Aisak we mua Jekob, Jekob we mua nna uku ayi iri na abua.


Mb͕e nwoke nwere ndinyom abua, ma otù nime ha bu nwayi anāhu n'anya, nke-ọzọ aburu nwayi anākpọ asì, asi kwa na ha amuworo ya umu-ndikom, ma nwayi anāhu n'anya ma nwayi anākpọ asì; ma ọkpara bu nwa nwayi anākpọ asì muru;


Boaz we kuru Rut, o we ghọrọ ya nwunye; o we bakuru ya, Jehova we me ka ọ turu ime, ọ mua nwa-nwoke.


O rue, n'ọb͕ub͕a arọ, na Hana turu ime, mua nwa-nwoke; o we kpọ aha-ya Samuel, si, N'ihi na ọ bu n'aka Jehova ka m'riọworo ya.


Ekpere bayere nwata nka ka m'kpere; Jehova we nyem aririọm nke m'riọrọ n'aka-Ya:


ma o nyere Hana òkè madu abua: n'ihi na ọ bu Hana ka ọ huru n'anya, ma Jehova mechiri àkpà-nwa-ya.


N'ihi na Jehova letara Hana, o we turu ime, mua umu-ndikom atọ na umu-ndinyom abua. Nwata ahu, bú Samuel, we nētó n'ulo Jehova.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan