Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 29:30 - Bible Nso

30 Ọ we bakuru kwa Rechel, ọ we hu kwa Rechel n'anya kari Lia, we nēfè òfùfè n'aka Leban arọ asa ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

30 Jekọb bakwukwara Rechel. Ọ hụrụ Rechel nʼanya nke ukwuu karịa Lịa. Ọ gbakwaara Leban odibo afọ asaa ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 29:30
17 Iomraidhean Croise  

Anya Lia esighi ike; ma Rechel mara nma n'aru ma kwa nma ile anya.


Jekob we hu Rechel n'anya; ọ si, M'gēfè gi arọ asa n'ihi Rechel, bú nwa-gi nwayi nke-ntà.


Jekob we fè òfùfè n'ihi Rechel arọ asa; ha di n'anya-ya dika ubọchi ole-na-ole, n'ihi ihu-n'anya o ji hu ya.


Leban we were Bilha, bú nwayi nējere ya ozi, nye Rechel nwa-ya nwayi, ka ọ buru nwayi nējere ya ozi.


Jehova we hu na onye anākpọ asì ka Lia bu, Ọ we meghe àkpà-nwa-ya: ma Rechel bu nwayi-àgà.


Ọ̀ bughi na ndi ala ọzọ ka ọ guworo ayi? n'ihi na ọ rewo ayi, ripiasia kwa ego-ayi.


Orú arọ a ka m'nọworo n'ulo-gi; m'efère gi arọ iri na anọ n'ihi umu-gi ndinyom abua, na arọ isi n'ihi ìgwè ewu na aturu-gi: i b͕anwewo kwa ugwọ-ọlum ub͕ò iri.


Ayi we si onye-nwem, Ayi nwere nna, bú agadi, na otù nwa agadi-ya, bú onye ntà; nwa-nne-ya anwuruwo kwa, ọ we fọdu nwata ahu nání ya nye nne-ya, nna-ya hukwara ya n'anya.


Orù-gi, bú nnam, we si ayi, Unu onwe-unu mara na umu-ndikom abua ka nwunyem muru nyem:


Jekob we b͕alaga n'ọhia Efraim, Israel we fè òfùfè n'ihi nwunye, ọ bu kwa n'ihi nwunye ka o debere aturu.


Onye nāhu nna-ya ma-ọbu nne-ya n'anya kari Mu adighi-ekwesim; onye nāhu kwa nwa-ya nwoke ma-ọbu nwa-ya nwanyi n'anya kari Mu adighi-ekwesim.


Ọ dighi onye ọ bula puru ibu orù nke nna abua: n'ihi na ọ gākpọ otù onye nime ha asì, hu ibe-ya n'anya; ma ọ bughi otú a ọ gējide otù, lelìa ibe-ya anya. Unu apughi ibu orù Chineke na àkù.


Ọ buru na onye ọ bula abiakutem, ma ọ kpọghi nna nke ya asì, ya na nne nke ya, na nwunye nke ya, na umu nke ya, na umu-nne-ndikom nke ya, na umu-nne-ndinyom nke ya, e, ndu nke aka ya kwa, ọ pughi ibu onye nēso uzọm.


Onye nāhu ndu-ya n'anya nētufu ya; onye nākpọ kwa ndu-ya asì n'uwa nka gēdebe ya rue ndu ebighi-ebi.


Mb͕e nwoke nwere ndinyom abua, ma otù nime ha bu nwayi anāhu n'anya, nke-ọzọ aburu nwayi anākpọ asì, asi kwa na ha amuworo ya umu-ndikom, ma nwayi anāhu n'anya ma nwayi anākpọ asì; ma ọkpara bu nwa nwayi anākpọ asì muru;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan