7 ọ hu kwa na Jekob gere nna-ya, ge kwa nne-ya, nti, we je Padan-eram:
7 Jekọb rubekwara nna ya na nne ya isi gawa Padan Aram.
Aisak b͕ara ọgu arọ abua mb͕e ọ lutara Rebeka na nwunye, bú nwa-nwayi Betuel onye Siria nke Padan-eram, nwa-nne-nwayi Leban onye Siria.
Ma ub͕u a, nwam, ge nti n'olum; bilie, b͕akuru Leban, bú nwa-nnem nwoke, rue Heran;
Isọ we hu na Aisak gọziri Jekob, zipu kwa ya ije Padan-eram, isi n'ebe ahu lutara onwe-ya nwunye; ọ hu kwa na, mb͕e ọ nāgọzi ya, na ọ nyere ya iwu, si, Gi alula nwunye sitere n'umu-ndinyom Kenean;
Isọ we hu na umu-ndinyom Kenean jọrọ njọ n'anya Aisak nna-ya;
Sọpuru nna-gi na nne-gi: ka ubọchi-gi we di anya n'elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.
Nwam, nuru idọ-aka-na-nti nke nna-gi, Arapu-kwa-la iwu nne-gi:
Anya nke nākwa nna-ya emò, Nke nēleda kwa iṅa nne-ya nti, Ugolo-ọma nke ndagwurugwu gāghuputa ya, Umu-ugo gēri kwa ya.
Unu gātu egwu, onye ọ bula ọ tua egwu nne-ya na nna-ya, unu gēdebe kwa ubọchi-izu-ikem nile: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.
Umu, nāṅanu nti okwu ndi muru unu nime Onye-nwe-ayi: n'ihi na nka bu ihe ziri ezi.
ka ihe we nāgara gi nke-ọma, ka i we di kwa ogologo ndu n'elu uwa.
Umu, nāṅanu nti okwu ndi muru unu n'ihe nile, n'ihi na nka bu ihe nātọ ezi utọ nime Onye-nwe-ayi.