Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 28:18 - Bible Nso

18 Jekob we bilie n'isi-ututu, were nkume ahu nke ọ dọbara n'okpuru isi-ya, do ya ka ọ buru ogidi, ọ wusa manu n'elu ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Nʼisi ụtụtụ echi ya, Jekọb weere nkume ahụ o hinyere nʼisi ya guzo ya dịka ogidi, wụsa mmanụ nʼelu ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 28:18
16 Iomraidhean Croise  

Abraham we bilie n'isi-ututu, were achicha na karama-akpukpọ miri nye Hega, tukwasi ya n'ubu-ya, ọ nye kwa ya nwa-ya, zilaga ya: ọ we je, nāwaghari n'ọzara Bia-sheba.


Abraham we bilie n'isi-ututu, jikwa inyinya-ibu-ya, chiri madu abua nime umu-okorọbia-ya tiyere onwe-ya, na Aisak, bú nwa-ya nwoke; ọ kpọwa nkú nke àjà-nsure-ọku, bilie, je ebe ahu nke Chineke siri ya-ri je.


Ọ biarue n'otù ebe, nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu, n'ihi na anya-nwu adawo; ọ were otù nime nkume nke ebe ahu, dọba n'okpuru isi-ya, we dina n'ebe ahu


Mu onwem bu Chineke nke Betel, ebe i tere ogidi manu, ebe i kwerem nkwa: ub͕u a bilie, si n'ala nka pua, laghachi n'ala nke ọmumu-gi.


Jekob we were nkume, guzo ya ka ọ buru ogidi.


Jekob we guzo ogidi ọtọ n'ebe ahu ebe Ọ kpayere ya uka, bú ogidi nkume: ọ wusi àjà-ihe-ọṅuṅu n'elu ya, wusa kwa manu n'elu ya.


Jekob we guzo ogidi ọtọ n'elu ílì-ya: nke ahu bu Ogidi ílì Rechel rue ta.


Ma Absalom, mb͕e ọ nọ na ndu, o were ogidi nke di na ndagwurugwu eze guzoro onwe-ya: n'ihi na ọ siri, Enweghm nwa-nwoke ime ka echeta aham: o we kpọ ogidi ahu n'aha-ya: ewe kpọ ya ihe-ncheta Absalom, rue ta.


Abiaram ọsọsọ, ọ b͕agwojughkwam anya, Idebe ihe nile I nyere n'iwu.


Ihe ọ bula aka-gi nāhu ime, were ike-gi me ya; n'ihi na ọ dighi ọlu, ma-ọbu ichè-èchìchè, ma-ọbu ihe-ọmuma, ma-ọbu amam-ihe, di n'ala-mọ, ebe gi onwe-gi nāla.


N'ubọchi ahu ebe-ichu-àjà gādiri Jehova n'etiti ala Ijipt, otù ogidi n'akuku ókè-ala-ya gādi-kwa-ra Jehova.


O rue, n'ubọchi Moses guzosiri ebe-obibi ahu, te ya manu, do ya nsọ, na ihe-ya nile, na ebe-ichu-àjà na ihe-ya nile, mb͕e ọ tesiri ha manu, do ha nsọ;


Joshua we guzo nkume iri na abua n'etiti Jọdan, bú ebe-nguzo siri ike nke ukwu ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu: ha we di n'ebe ahu, rue ta.


Samuel we were otù nkume do ya n'etiti Mizpa na Shen, kpọ aha-ya Eben-eza, si, Jehova eyerewo ayi aka rue ub͕u a.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan