Ubọchi Israel gānwu we rue nso: ọ kpọ nwa-ya Josef, si ya, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, biko, tiye aka-gi n'okpuru apata-ukwum, me-kwa-ram ebere na ezi-okwu; biko, elìlam n'Ijipt:
Ihe ọ bula aka-gi nāhu ime, were ike-gi me ya; n'ihi na ọ dighi ọlu, ma-ọbu ichè-èchìchè, ma-ọbu ihe-ọmuma, ma-ọbu amam-ihe, di n'ala-mọ, ebe gi onwe-gi nāla.
Na mb͕e ahu Hezekaia riara ọria inwu anwu. Aisaia, bú onye-amuma, bú nwa Emoz, we biakute ya, si ya, Otú a ka Jehova siri, Nye ulo-gi iwu; n'ihi na onye nānwu anwu ka i bu, I gaghi-adi kwa ndu.
si, Biko, Jehova, biko, cheta otú m'jeghariworo n'iru Gi n'ezi-okwu na n'obi zuru okè, ọ bu kwa ihe di nma n'anya-Gi ka m'meworo. Hezekaia we kwa ákwá nke-uku.
Ya mere, nēchenu nche: n'ihi na unu amataghi mb͕e Onye-nwe ulo gābia, ma ọ bu n'anyasi, ma-ọbu n'etiti abali, ma-ọbu mb͕e oke-ọkuku kwara, ma-ọbu n'ututu;
Devid we ṅua iyi ọzọ, si, Nna-gi amawo nke-ọma na ahutawom amara n'iru gi; o we si, Ka Jonatan ghara ima nka, ka o we ghara iwuta ya: ma otú ọ di, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, nání ihe ra ka otù nzọ-ukwu di n'ab͕ata mu na ọnwu.