Abraham we bilie n'isi-ututu, were achicha na karama-akpukpọ miri nye Hega, tukwasi ya n'ubu-ya, ọ nye kwa ya nwa-ya, zilaga ya: ọ we je, nāwaghari n'ọzara Bia-sheba.
ma unu achọla Bet-el, unu abà-kwa-la na Gilgal, unu agabiga-kwa-la ijeru Bia-sheba: n'ihi na aghaghi ime ka Gilgal je biri n'ala ọzọ, Bet-el gāghọ kwa ajọ ihe.