Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 26:14 - Bible Nso

14 ọ we nwe ihe-nnweta, bú ìgwè ewu na aturu, na ihe-nnweta, bú igwè ehi, na ọtutu ndi-orù: ndi Filistia we nēkwo ya ekworo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 O nwere ọtụtụ igwe anụ ụlọ, na igwe ehi, na ndị ikom na-ejere ya ozi. Nʼihi ihe ndị a, ndị Filistia bidoro inwe anya ukwu megide ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 26:14
16 Iomraidhean Croise  

Ọ we me Abram nke-ọma n'ihi ya: ọ we nwe ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, na oke-inyinya-ibu, na ndi-orù ndikom, na ndinyom nēje ozi, na nne-inyinya-ibu, na kamel.


Abram bu kwa ọgaranya nke-uku n'anu-ulo na n'ọla-ọcha, na n'ọla-edo.


Jehova agọziwo kwa onye-nwem nke-uku; o we di uku: O nyewo kwa ya ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, na ọla-ọcha na ọla-edo, na orù-ndikom na ndinyom nēje ozi, na camel na inyinya-ibu di ọtutu.


Abraham we nye Aisak ihe nile o nwere.


Nwoke ahu we basa nke-uku nke-uku, ọ we nwe ìgwè ewu na aturu ri nne, na ndinyom nēje ozi, na orù-ndikom, na camel na inyinya-ibu di ọtutu.


Umu-nne-ya we kwo ya ekworo; ma nna-ya debere okwu ahu.


Ihe-nnweta-ya di nnù ewu na aturu iri-na-asa na ọgu iri, na nnù camel asa na ọgu iri, na nnù ehi abua na ọgu iri ejikọrọ abua abua, na nnù nne-inyinya-ibu na ọgu ise, na ndi-orù bara uba nke-uku; nwoke ahu we di uku kari umu Iru-anyanwu nile.


Ọzọ, Jehova gọziri ikpe-zu Job kari nmalite-ya, o we nwe orú nnù ewu na aturu na nnù iri-na-ise, na nnù camel iri-na-ise, na nnù ehi ise ejikọrọ abua abua, na nnù nne-inyinya-ibu abua na ọgu iri.


N'ihi na nkpasu-iwe nēb͕u onye b͕agọro ab͕ago n'uche-ya, Ekworo nēme kwa ka onye nenweghi uche nwua.


Onye nēmebi iwu gāhu ya, ewe kpasue ya iwe; Ọ gāta ikekere-ezé, b͕aze kwa: Ọchichọ ndi nēmebi iwu nāchọsi ike gāla n'iyì.


Ihe di iche iche di oké ọnu-ahia na àkù di n'ulo-ya: Ezi omume-ya nēguzo kwa rue mb͕e ebighi-ebi.


Ngọzi Jehova, nke ahu nēme madu ọgaranya, Ọ dighi-atukwasi kwa ya ihe-nwuta.


Ihe nēnweghi obi-ebere ka ọnuma bu, iju-miri ka iwe bu kwa; Ma ònye gēguzo n'iru ekworo?


Mu onwem we hu ndọb͕u nile madu nādọb͕u onwe-ha n'ọlu, ya na ọlu nile nāgafe agafe, na ọ bu n'ihi nka ka madu gābu onye madu-ibe-ya gēkwoso ekworo. Nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe.


Sọl we nēle Devid anya ọjọ site n'ubọchi ahu ga n'iru.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan