7 Ma ndia bu ubọchi arọ nile nke ndu Abraham nke ọ diri, ọgu arọ asatọ na arọ iri na ise.
7 Ebraham dị ndụ ruo narị afọ na iri afọ asaa na ise.
Abram we je, dika Jehova gwara ya okwu; Lot we so ya je: Abram b͕ara ọgu arọ atọ na iri na ise mb͕e o siri na Heran pua.
Ubọchi Aisak we buru ọgu arọ iteghete.
Aisak we kubie ume, nwua, ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ, ọ bu agadi, ubọchi-ya jukwara ya afọ: Isọ na Jekob, bú umu-ya ndikom, we lìe ya.
Jekob we di ndu n'ala Ijipt arọ iri na asa: ubọchi Jekob, bú arọ ndu-ya, we di ọgu arọ asa na asa.
Jekob we si Fero, Ubọchi arọ nke ọnọdu-ọbìam nile di ọgu arọ isi na iri: ha di ole-na-ole, jọ kwa njọ, bú ubọchi arọ ndum, ha erughi kwa ubọchi arọ ndu nke nnam-hà n'ubọchi ọnọdu-ọbia-ha.
Josef we nwua, ọ b͕ara ọgu arọ ise na iri: ha we b͕asì ozu-ya etiye ya n'ib͕e n'Ijipt.