Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 25:31 - Bible Nso

31 Jekob we si, Buru uzọ rebem ọnọdu-ọkpara-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

31 Ma Jekọb zara ya, “Buru ụzọ resi m ọnọdụ ịbụ ọkpara gị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 25:31
9 Iomraidhean Croise  

Isọ we si Jekob, Biko, kwe ka m'loda ufọdu nime ihe a nācha ọbara ọbara; n'ihi na ada-wom #mbà; n'ihi nka ka akpọrọ aha-ya Edom.


Isọ we si, Le, mu onwem gaje inwu anwu: ọ̀ gāba-kwa-ram urù gini, bú ọnọdu-ọkpara?


Ọ si, Ọ̀ bu na akpọrọ aha-ya Jekob na o jidewom ikiri-ukwu ub͕ò abua ndia? ọnọdu-ọkparam ka ọ nara: ma, le, ub͕u a ka ọ naraworo ngọzim. Ọ si, Ọ̀ dighi ngọzi i debeworom?


Ọ si, Ọ bughi Jekob ka agākpọ aha-gi ọzọ, kama Israel: n'ihi na i jisiwo ike n'ebe Chineke nọ na n'ebe madu nọ, i we nwe ike.


Ma umu-ndikom Reuben ọkpara Israel, (n'ihi na onye ahu bu ọkpara; ma, n'ihi na o mere ute nna-ya ka ọ ghara idi nsọ, enyere umu Josef nwa Israel ọnọdu-ọkpara-ya; agaghi-ede kwa ya n'akwukwọ-osuso-ọmumu dika ọnọdu-ọkpara si di.


N'ihi na Juda di ike n'etiti umu-nne-ya, onye-ndú we si nime ya puta; ma Josef nwere ọnọdu-ọkpara:)


ọ gēru kwa, n'ubọchi mb͕e ọ nēme ka umu-ya ndikom keta ihe o nwere, na ọ pughi ime ka nwa-nwoke nke nwayi anāhu n'anya buru ọkpara n'iru nwa-nwoke nke nwayi anākpọ asì, bú ọkpara:


kama ọ gēkwe na ọkpara ka ọ bu, bú nwa-nwoke nke nwayi anākpọ asì, n'inye ya òkè abua n'ihe ọ bula ahutara n'aka-ya: n'ihi na nwa ahu bu nkpuru mbu nke ume-ya; ọ bu ya nwe ihe ekpeziri ọnọdu-ọkpara.


ma ọ di onye ọ bula nke nākwa iko, ma-ọbu nke emeruru emeru, dika Isọ, onye rere di-ọkpara ya onwe-ya bu n'ọnọdu otù oriri.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan