Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 25:26 - Bible Nso

26 Emesia nwa-nne-ya nwoke puta-kwa-ra, aka-ya nējide ikiri-ukwu Isọ; ewe kpọ aha-ya Jekob: Aisak b͕ara ọgu arọ atọ mb͕e Rebeka muru ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 Emesịa, nwanne ya pụtara, ma aka ya jidere ikiri ụkwụ Ịsọ. Nʼihi ya, a kpọrọ aha ya Jekọb. Aịzik gbara iri afọ isii mgbe Ribeka mụrụ ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 25:26
13 Iomraidhean Croise  

Abraham b͕ara ọgu arọ ise, mb͕e amuru ya Aisak, bú nwa-ya nwoke.


Aisak b͕ara ọgu arọ abua mb͕e ọ lutara Rebeka na nwunye, bú nwa-nwayi Betuel onye Siria nke Padan-eram, nwa-nne-nwayi Leban onye Siria.


Ọ si, Ọ̀ bu na akpọrọ aha-ya Jekob na o jidewom ikiri-ukwu ub͕ò abua ndia? ọnọdu-ọkparam ka ọ nara: ma, le, ub͕u a ka ọ naraworo ngọzim. Ọ si, Ọ̀ dighi ngọzi i debeworom?


Ubọchi Aisak we buru ọgu arọ iteghete.


Abraham muru Aisak. Umu-ndikom Aisak; Isọ, na Israel.


Mb͕e ọ nọ n'afọ o jidere nwa-nne-ya n'ikiri-ukwu; ọ bu kwa n'ume-ya ka o jisiri ike n'ebe Chineke nọ:


o we jisie ike n'aru Mọ-ozi, we nwe ike kari: ọ kwara ákwá, riọ Ya aririọ: nime Bet-el ka Ọ chọtara ya, ọ bu kwa n'ebe ahu ka Ọ kpayere ayi uka;


Ahuwom unu n'anya, ka Jehova siri. Ma unu nāsi, Nìme gini ka I huworo ayi n'anya? Isọ, ọ̀ bughi nwa-nne Jekob? (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): otú ọ di, anamahu Jekob n'anya;


Moses we si na Kedesh zigara eze Edom ndi-ozi, si, Otú a ka Israel, bú nwa-nne-gi, siri, Gi onwe-gi amawo ike-ọgwugwu nile nke gwuworo ayi:


O we nye ya ọb͕ub͕a-ndu nke obibì-úgwù: otú a Abraham we mua Aisak, we bì ya úgwù n'ubọchi nke-asatọ; Aisak we mua Jekob, Jekob we mua nna uku ayi iri na abua.


Umu agāmuru ha, ọb͕ọ nke-atọ ha, gābà nime nkpọkọta Jehova.


M'we nye Aisak Jekob na Isọ: M'we nye Isọ ugwu Sia, ka ọ nweta ya; ma Jekob na umu-ya ridara n'Ijipt.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan