24 Ubọchi-ya we zue imu nwa, ma, le, umu abua di n'afọ-ya.
24 Mgbe oge ime ya zuru, ụmụ abụọ dị nʼakpanwa ya.
Jehova we si ya, Mba abua di n'afọ-gi, Agēkewa kwa mba abua site n'úkwù-gi; Otù mba gēnwe ume kari mba ibe-ya; Nke-okenye gēfè nke-ntà.
Nke-mbu we puta nācha ọbara ọbara, aru-ya nile di ka uwe aji; ha we kpọ aha-ya Isọ.
Ma ndia bu osuso-ọmumu Isọ (nke ahu bu Edom).
O rue na, nime mb͕e ọmumu-nwa-ya, le, umu abua di n'afọ-ya.
Abraham muru Aisak. Umu-ndikom Aisak; Isọ, na Israel.
Akpọla onye Edom ihe árú; n'ihi na nwa-nne-gi ka ọ bu: akpọla onye Ijipt ihe-árú; n'ihi na ọbìa ka i buri n'ala-ya.
M'we nye Aisak Jekob na Isọ: M'we nye Isọ ugwu Sia, ka ọ nweta ya; ma Jekob na umu-ya ridara n'Ijipt.