Umu-ndikom Ketura kwa, bú nwayi-iko Abraham: ọ muru Zimran, na Jọkshan, na Medan, na Midian, na Ishbak, na Shua. Umu-ndikom Jọkshan kwa; Sheba, na Dedan.
O we nye ya ọb͕ub͕a-ndu nke obibì-úgwù: otú a Abraham we mua Aisak, we bì ya úgwù n'ubọchi nke-asatọ; Aisak we mua Jekob, Jekob we mua nna uku ayi iri na abua.