1 Abraham we luru nwunye ọzọ, nke aha-ya bu Ketura.
1 Ebraham lụrụ nwunye ọzọ, onye aha ya bụ Ketura.
Aisak we me ka Rebeka bata n'ulo-ikwū Sera, bú nne-ya, o we kuru Rebeka, o we ghọ nwunye-ya; Aisak we hu ya n'anya: ewe kasie Aisak obi ka nne-ya nwusiri.
Ọ muara ya Zimram, na Jọkshan, na Medan, na Midian, na Ishbak, na Shua.
Aisak we kpọ Jekob, gọzie ya, nye ya iwu, si ya, Gi alula nwunye sitete n'umu-ndinyom Keneam.