Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 24:59 - Bible Nso

59 Ha we zilaga Rebeka, bú nwa-nne-ha, na nwayi nyere ya ara na nwata, na orù Abraham, na ndikom-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

59 Ya mere, ha zipụrụ nwanne ha nwanyị Ribeka, tinyere nwanyị lekọtara ya anya mgbe ọ dị na nwantakịrị, na ohu Ebraham na ndị ikom so ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 24:59
8 Iomraidhean Croise  

Leban na Betuel we za, si, N'aka Jehova ka okwu a siteworo: ayi apughi igwa gi ihe ọjọ ma-ọbu ezi ihe.


Orù ahu we chiputa ihe ọla-ọcha, na ihe ọla-edo, na uwe, nye Rebeka: ihe di iche iche nke di oké ọnu-ahia ka ọ nyekwara nwa-nne-ya nwoke na nne-ya.


Ha we rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ya onwe-ya na ndi ya na ha yikọrọ bia, ha we nọ ọnọdu-abali; ha we bilie n'ututu, ọ si, Zilagam na nke onye-nwem.


Ha we kpọ Rebeka, si ya, Ì gēso nwoke a je? Ọ si, M'gēje.


Ha we gọzie Rebeka, si ya, Nwa-nne-ayi, gi onwe-gi ghọ nnù kwuru nnù madu, ọzọ, ka nkpuru-gi nweta ọnu-uzọ-ama nke ndi nākpọ ha asì.


Debora, bú nwayi nyere Rebeka ara na nwata, we nwua, elìe ya n'okpuru Bet-el n'okpuru osisi oak: ewe kpọ aha-ya Alon-bakut.


Ọ̀ bu mu onwem turu ime ndi nka nile? ọ̀ bu mu onwem muru ha, na I nāsim, Kuru ha n'obi-gi, dika nna-nāzù-nwa si eku nwa nāṅu ara, rue ala ahu nke I ṅuru ndi bu nna-ha iyi inye ha?


N'ihi na ọ dighi mb͕e ọ bula ahuru ayi n'ikwu okwu nrafu, dika unu matara, ma-ọbu n'iwere aghughọ b͕achita anya-uku, Chineke bu onye-àmà;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan