38 kama ọ bu ulo nnam ka i gējekuru, jekuru ab͕urum, lutara nwam nwunye.
38 Kama ị ga-aga nʼezinaụlọ nna m, na nke ndị ikwu m chọtara nwa m nwoke nwunye.’
Jehova we si Abram, Si n'ala-gi, si kwa n'umu-nna-gi, si kwa n'ulo nna-gi, je nke gi rue ala ahu nke M'gēme ka i hu ya anya:
Onye-nwem we me ka m'ṅua iyi, si, I gaghi-alutara nwam nwunye sitere n'umu-ndinyom nke ndi Kenean, ndi mu onwem bi n'ala-ha:
M'we si onye-nwem, Eleghi anya nwayi ahu agaghi-esom je.
kama ọ bu alam na umu-nnam ka i gējekuru, lutara nwam, bú Aisak, nwunye.
Ma Leban jere ikpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya: Rechel we zue teraphim nke nna-ya nwere n'ori.