Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 24:35 - Bible Nso

35 Jehova agọziwo kwa onye-nwem nke-uku; o we di uku: O nyewo kwa ya ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, na ọla-ọcha na ọla-edo, na orù-ndikom na ndinyom nēje ozi, na camel na inyinya-ibu di ọtutu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

35 Onyenwe anyị agọziela nna m ukwu, mee ya ka ọ bụrụ ọgaranya. O nyela ya igwe atụrụ, na igwe ehi, na ọlaọcha na ọlaedo, na ọtụtụ ndị ohu nwoke na nwanyị, na ịnyịnya kamel, na ịnyịnya ibu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 24:35
20 Iomraidhean Croise  

Ọ we me Abram nke-ọma n'ihi ya: ọ we nwe ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, na oke-inyinya-ibu, na ndi-orù ndikom, na ndinyom nēje ozi, na nne-inyinya-ibu, na kamel.


M'gēme kwa gi ka i ghọ mba uku, M'gāgọzi kwa gi, me ka aha-gi di uku; gi buru kwa ngọzi:


M'gāgọzi kwa ndi nāgọzi gi, ọ bu kwa onye nākọcha gi ka M'gābu ọnu: agāgọzi kwa ab͕uru nile nke uwa nime gi.


Abram bu kwa ọgaranya nke-uku n'anu-ulo na n'ọla-ọcha, na n'ọla-edo.


Ma Abraham ghọrọ agadi, ubochi nduya nāgwu: Jehova gọzikwarari Abraham n'ihe nile.


O rue, mb͕e ọnwu Abraham gasiri, na Chineke gọziri Aisak nwa-ya; Aisak we biri n'akuku Bia-lahai-roi.


Abraham we nye Aisak ihe nile o nwere.


Nwoke ahu we basa nke-uku nke-uku, ọ we nwe ìgwè ewu na aturu ri nne, na ndinyom nēje ozi, na orù-ndikom, na camel na inyinya-ibu di ọtutu.


Site na Chineke nke nna-gi; Ya yere gi aka! Na Onye Nke puru ime ihe nile; Ya gọzie gi! Ngọzi nile nke elu-igwe site n'elu, Ngọzi nile nke ob͕u-miri nke nāma-kpu n'okpuru, Ngọzi nile nke ara na nke àkpà-nwa.


Ihe-nnweta-ya di nnù ewu na aturu iri-na-asa na ọgu iri, na nnù camel asa na ọgu iri, na nnù ehi abua na ọgu iri ejikọrọ abua abua, na nnù nne-inyinya-ibu na ọgu ise, na ndi-orù bara uba nke-uku; nwoke ahu we di uku kari umu Iru-anyanwu nile.


Ọ nāgọzi kwa ha, ha we ba uba nke-uku; Ọ dighi-eme kwa ka anu-ulo-ha bilata.


Ihe di iche iche di oké ọnu-ahia na àkù di n'ulo-ya: Ezi omume-ya nēguzo kwa rue mb͕e ebighi-ebi.


I nyewokwam ọta nzọputa-Gi: Aka-nri-Gi nākwagidekwam, Ume-ala-n'obi nke Gi nēmekwam ka m'ba uba.


Ngọzi Jehova, nke ahu nēme madu ọgaranya, Ọ dighi-atukwasi kwa ya ihe-nwuta.


Ọkpukpu-ọlu nke obi ume-ala na egwu Jehova Bu àkù, na nsọpuru, na ndu.


Ma burunu uzọ chọ ala-eze-Ya, na ezi omume-Ya; agātukwasi-kwa-ra unu ihe ndia nile.


Ma ọ buru na orù ahu gāsi n'obi-ya, Onye-nwem nānọ ọdù di anya ibia; ọ buru kwa na ọ gāmalite iti ndikom na ndinyom nēje ozi aka, na iri ihe-oriri na iṅu ihe-ọṅuṅu, na iṅubiga manya ókè;


n'ihi na ọnwunwa nke aru bara urù nye ihe ntà; ma nsọpuru-Chineke bara urù nye ihe nile, ebe o nwere nkwa nke ndu, ma nke ndu ub͕u a, ma nke gaje ibia.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan