Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 24:31 - Bible Nso

31 O we si, Bata, gi onye agọziri agọzi nke Jehova; n'ìhi gini ka i nēguzo n'èzí? n'ihi na mu onwem edoziwo ulo, na ebe camel-i gānọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

31 Ọ sịrị ya, “Bịa, gị onye Onyenwe anyị gọziri. Gịnị mere i ji guzo nʼebe a. Edozielara m gị ụlọ ebe ị ga-edina na ebe ịnyịnya kamel ndị a ga-anọ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 24:31
11 Iomraidhean Croise  

si, Onye-nwem, biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, biko, esila n'ebe orù-gi nọ gabiga:


si, Biko, le, ndi-nwem, biko, sinu n'ije-unu wezuga onwe-unu bà n'ulo orù-unu, nọ ọnọdu-abali, sa kwa ukwu-unu, unu gēbili n'isi-ututu, la, Ha si, É-è, kama ọ bu n'amá ka ayi gānọ ọnọdu-abali.


O rugide ha nke-uku; ha we si n'ije-ha wezuga onwe-ha jekuru ya, ba n'ulo-ya; O we mere ha oké oriri, sie achicha ekoghi-eko, ha rie.


O rue, mb͕e ọ huru nb͕a-aka ahu, na ọla-aka abua di n'aka nwa-nne-ya nwayi, mb͕e ọ nukwara okwu nile nke Rebeka nwa-nne-ya nwayi, si, Otú a ka nwoke ahu gwaram; na o biakutere nwoke ahu; ma, le, o nēguzo n'akuku camel-ya n'akuku isi-iyi ahu.


na i gaghi-eme ayi ihe ọjọ ma-ọli dika ayi nēmetughi gi aka na dika ayi meworo gi nání ezi ihe, ayi we zilaga gi n'udo: ub͕u a gi onwe-gi bu onye agọziri agọzi nke Jehova.


O rue, mb͕e Leban nuru akukọ Jekob, bú nwa nwa-nne-ya, na ọ b͕ara ọsọ izute ya, ọ b͕akua ya, sutu ya ọnu nke-uku, me ka ọ ba n'ulo-ya. Ọ we kọrọ Leban ihe nile ndia.


Ndi agọziri agọzi diri Jehova ka unu bu, Onye meworo elu-igwe na uwa.


Nkume amara ka iri-ngo bu n'anya ndi-nwe-ya: Ebe ọ bula ọ nēche iru ọ nāgara ya.


Onyinye madu nākwara ya uzọ sara mbara, Ọ bu kwa n'iru ndi uku ka o nēdu ya je.


Ọ si nne-ya, Nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri-na-ise ahu i nwere nke ewere ewere, nke gi onwe-gi b͕ara iyi bayere ya, i we kwu kwa ya na ntim, le, ọla-ọcha ahu di n'akam; mu onwem were ya. Nne-ya we si, Onye agọziri agọzi diri Jehova ka nwam bu.


_O si, Nwayi agọziri agọzi diri Jehova ka i bu, nwam: i mewo ebere nke-ọma n>ikpe-azu kari na mbu, ebe i n=ejesoghi umu-okorọbia, ma ọ bu onye n=enweghi ike ma-ọbu ọgaranya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan