Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 24:3 - Bible Nso

3 m'gēme kwa gi ka i were Jehova, bú Chineke nke elu-igwe na Chineke nke uwa, ṅu iyi, na i gaghi-alutara nwam nwunye sitere n'umu-ndinyom nke ndi Kenean, ndi mu onwem bi n'etiti ha:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Achọrọ m ka i jiri aha Onyenwe anyị Chineke nke eluigwe na ụwa, ṅụọra m iyi, na ị gaghị achọtara nwa m nwoke nwunye site nʼetiti ndị Kenan, ndị m bi nʼetiti ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 24:3
49 Iomraidhean Croise  

Ọ we gọzie ya, si, Onye agọziri agọzi ka Abram bu site n'aka Chineke Nke kachasi ihe nile elu, bú Onye-nwe elu-igwe na uwa:


Abram we si eze Sọdọm, Eweliwom akam nye Jehova, bú Chineke Nke kachasi ihe nile elu, Onye-nwe elu-igwe na uwa,


ma ub͕u a were Chineke ṅuaram iyi n'ebe a na i gaghi-agwa mu onwem, ma-ọbu umum, ma-ọbu umu umum, okwu-ugha: ọ bu dika ebere nke m'meworo gi si di ka i gēmerem, mekwaram ala nke i nọworo dika ọbìa nime ya.


Jehova, bú Chineke nke elu-igwe, Nke si n'ulo nnam, na n'ala amurum, kuputam, Nke gwakwara m okwu, Nke ṅukwara m iyi, si, Nkpuru-gi ka M'gēnye ala nka; Ya onwe-ya gēziga mọ-ozi-Ya n'iru gi, i gēsi kwa n'ebe ahu lutara nwam nwunye.


Rebeka we si Aisak, Ike ndum agwusiwom site n'iru umu-ndinyom Het: ọ buru na Jekob luru nwunye sitere n'umu-ndinyom Het, dika ndia, bú site n'umu-ndinyom ala nka, ùrù gini ka ndu baram?


Aisak we kpọ Jekob, gọzie ya, nye ya iwu, si ya, Gi alula nwunye sitete n'umu-ndinyom Keneam.


Isọ we hu na umu-ndinyom Kenean jọrọ njọ n'anya Aisak nna-ya;


Ka ayi na unu nālurita kwa nwunye; nyenu ayi umu-unu ndinyom, kurukwanu umu-ayi ndinyom n'onwe-unu.


Juda we hu n'ebe ahu nwa-nwayi nke otù nwoke, bú onye Kenean, nke aha-ya bu Shua; ọ we kuru ya, bakuru ya.


Ọ si, Ṅuaram iyi: o we ṅuara ya iyi. Israel we kpọ isi ala n'elu ihe-ndina-ya.


Josef we me ka umu Israel ṅua iyi, si, Chineke gēleta unu n'ezie, unu gēsi kwa n'ebe a bugo ọkpukpum.


na umu-ndikom nke Chineke huru umu-ndinyom nke madu na ha mara nma; ha we lutara onwe-ha ndinyom site na ndi nile ha rọputara.


Nefilim nọ n'uwa na mb͕e ahu, ha nọ kwa ma emesia, mb͕e umu-ndikom nke Chineke nābakuru umu-ndinyom nke madu, mb͕e ha nāmukwara ha umu: ndi ahu bu ndi-dike ahu ndi nọri site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ndi amara aha-ha.


Hezekaia we kpe ekpere n'iru Jehova, si, Jehova, bú Chineke Israel, Onye nēbi n'etiti cherubim, Gi onwe-gi bu Chineke, nání Gi, nke ala-eze nile nke uwa; Gi onwe-gi mere elu-igwe na uwa.


Huram we si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Onye mere elu-igwe na uwa, Onye nyeworo Devid, bú eze, nwa-nwoke nke mara ihe, onye mara ezi uche na nghọta, onye gēwuru Jehova ulo, wu-kwa-ra ala-eze-ya ulo.


Ma otú a ka ha zaghachiri ayi okwu, si, Ayi onwe-ayi bu ndi-orù nke Chineke nke elu-igwe na uwa, ayi nēwu kwa ulo nke ewuru ọtutu arọ gara aga site na mb͕e a, nke otù eze uku nke Israel nwere wuru, wuzu kwa.


Mu na ha we se okwu, m'we kọcha ha, tie ufọdu nime ha aka, kwopu agiri-isi-ha, me ka ha were Chineke ṅua iyi, si, Unu ewela umu-unu ndinyom nye umu-ha ndikom, unu aluta-kwa-lara umu-unu ndikom, ma-ọbu onwe-unu, umu-ha ndinyom.


Gi onwe-gi bu Jehova, nání Gi; Gi onwe-gi emewo elu-igwe, bú elu-igwe nke elu-igwe nile, na usu-ha nile, na uwa na ihe nile nke di n'elu ya, na oké osimiri nile na ihe nile nke di nime ha, Gi onwe-gi nēdebe kwa ha nile ndu; usu ihe elu-igwe nākpọ kwa isi ala nye Gi.


Ndi agọziri agọzi diri Jehova ka unu bu, Onye meworo elu-igwe na uwa.


Kelenu Chineke nke elu-igwe: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.


Gi eburula aha Jehova, bú Chineke-gi, ime ihe efu; n'ihi na Jehova agaghi-agu onye nēburu aha-Ya ime ihe efu n'onye ikpé nāmaghi.


Iyi nke Jehova gādi n'etiti ha abua, imara ma o setipughi aka-ya n'aru ihe ibe-ya jetara n'ozi; onye-nwe anumanu ahu gānara ya, ọ gaghi-akwughachi kwa.


Ma n'ihe nile M'siworo unu lezienu anya: unu ehota-kwa-la aha chi ọ bula ọzọ, ka aghara kwa inu ya n'ọnu-gi.


i we lutara umu-gi ndikom ufọdu nime umu-ha ndinyom, umu-ha ndinyom we so chi-ha nākwa iko, me kwa ka umu-gi ndikom soro chi-ha nākwa iko.


Ejiwom Onwem ṅua iyi, otù okwu esiwo n'ọnum puta n'ezi omume, ọ gaghi-alaghachi kwa, si, na Mu onwem ka ikperè nile ọ bula gēb͕uru, Mu ka ire nile ọ bula gāṅuru iyi.


Nurunu nka, unu ulo Jekob, ndi anākpọ n'aha Israel, ndi siwo-kwa-ra na miri Juda puta; ndi ji aha Jehova aṅu iyi, ọ bu kwa Chineke Israel ka ha nēhota, ma ọ bughi n'ezi-okwu, ọ bughi kwa n'ezi omume.


onye ahu nke nāgọzi onwe-ya n'uwa ewe gọzie onwe-ya nime Chineke nke ezi-okwu; onye ahu kwa nke nāṅu iyi n'uwa gēji Chineke nke ezi-okwu ṅua; n'ihi na echezọwo ahuhu mbu nile, na n'ihi na ezonariwo ha n'anyam abua.


Otú a ka unu gāsi ha, Chi nile nke nēmeghi elu-igwe na uwa, ha gāla n'iyì pua n'uwa na n'okpuru elu-igwe, bú chi ndia.


Ọ gēru kwa, ọ buru na ha amuta uzọ nile nke ndim nke-ọma, iji aham ṅu iyi, si, Jehova nādi ndu; dika ha zíri ndim iji Beal ṅu iyi; agēwuli kwa ha dika ulo n'etiti ndim.


luanu nwunye, mua umu-ndikom na umu-ndinyom; lu-kwa-ranu umu-unu ndikom nwunye, lu-kwa-ranu umu-unu ndinyom di, ka ha we mua umu-ndikom na umu-ndinyom; ba-kwa-nu uba n'ebe ahu, ghara ibilata.


i gāṅu kwa iyi, Jehova nādi ndu, n'ezi-okwu, na n'ikpé ziri ezi, na n'ezi omume; mba nile gāgọzi kwa onwe-ha nime Ya, ọ bu kwa nime Ya ka ha gānya isi.


Unu ewe-kwa-la aham ṅu iyi n'okwu-ugha, we me ka aha Chineke-gi ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova.


na ndi nākpọ isi ala nye usu ihe nile di n'elu-igwe n'elu-ulo nile; na ndi nākpọ isi ala, ndi nāṅuru Jehova iyi, ndi ji kwa Malkam aṅu iyi;


onye-nchu-àjà gēwere kwa iyi nke ọb͕ub͕a-iyi ahu me ka nwayi ahu ṅua iyi, onye-nchu-àjà gāsi nwayi ahu, Jehova gēme gi ka i buru ihe-ọb͕ub͕a-iyi ka i buru kwa ihe-oṅuṅu-iyi n'etiti ndi-gi, mb͕e Jehova nēme ka apata-ukwu-gi bua aru, me kwa ka afọ-gi za aza;


Ekewo nwunye n'aru di-ya ka oge di-ya nọ na ndu ra; ma asi na di-ya adawo n'ura ọnwu, o nwere onwe-ya ilu di ọ nāchọ; ma ọ bu nání nime Onye-nwe-ayi.


Jehova, bú Chineke-gi, ka i gātu egwu; Ya ka i gēfè, Ya ka i gārapara n'aru, aha-Ya ka i gēji ṅu iyi.


Jehova, bú Chineke-gi, ka i gātu egwu; ọ bu kwa Ya ka i gēfè òfùfè, ọ bu kwa aha-Ya ka i gēwere ṅu iyi.


N'ihi na madu ji onye ka ha uku aṅu iyi: iṅu-iyi bu-kwa-ra ha nkwubì-okwu nke okwu ọ bula, ime ka o guzosie ike.


Ma ub͕u a, biko, werenu Jehova ṅuaram iyi, n'ihi na emerem unu ebere, na unu, ọbuná unu onwe-unu, gēmere ulo nnam ebere, nyekwam ihe-iriba-ama ezi-okwu:


Nna-ya na nne-ya we si ya, Ọ̀ dighi nwayi di n'etiti umu-ndinyom umu-nne-gi, ma-ọbu n'etiti ndim nile, na gi onwe-gi nēje iluru nwunye sitere na ndi Filistia, bú ndi anēbìghi úgwù? Samson we si nna-ya, Lutaram ya; n'ihi na ya onwe-ya ziri ezi n'anyam.


Jonatan we me kwa ka Devid ṅua iyi ọzọ, n'ihi na ọ huru ya n'anya: n'ihi na dika ọ huru nkpuru-obi nke onwe-ya n'anya, otú a ka ọ huru Devid n'anya.


Devid we si ya, Ì gēme ka m'ridakuru usu ahu ndi nāpunara madu ihe? Ọ si, Were Chineke ṅuaram iyi, na i gaghi-eme ka m'nwua, na i gaghi-emechibidokwam nye n'aka onye-nwem, m'gēme kwa ka i ridakuru usu ahu ndi nāpunara madu ihe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan