Abraham we si umu-okorọbia-ya, Nọdunu ebe a n'onwe-unu, unu na inyinya-ibu, ma mu onwem na nwa-okoro a gēje ebe ahu; ayi gākpọ kwa isi ala, chigharikute unu.
Devid we si nkpọkọta ahu nile, Biko, gọzienu Jehova, bú Chineke-unu. Nkpọkọta ahu nile we gọzie Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, ha we rube isi, kpọ isi ala nye Jehova, nye kwa eze.
Hezekaia, bú eze, na ndi-isi we si ndi Livai ka ha were okwu nke Devid, na nke Esaf, bú onye-ọhu-uzọ, to Jehova. Ha we to Chineke rue ọṅù, ha we rube isi kpọ isi ala.
Ezra we gọzie Jehova, bú Chineke uku. Ndi ahu nile we za, si, Amen, Amen, n'ichili aka-ha elu: ha we rube isi-ha, kpọ isi ala nye Jehova, kpue iru-ha n'ala.
na unu gāsi, Àjà ngabiga ka ọ bu nke anāchuru Jehova, Onye gabigara ulo nile nke umu Israel n'Ijipt, mb͕e O tiri ndi Ijipt ihe, O we naputa ulo nile ayi. Ndi Israel we rube isi, kpọ isi ala.
O rue, mb͕e Gideon nuru ọzize nrọ ahu na akukọ-isi-ya, na ọ kpọrọ isi ala; o we laghachi n'ọmuma-ulo-ikwū Israel, si, Bilienu; n'ihi na Jehova enyewo ọmuma-ulo-ikwū Midian n'aka unu.
ọzọ kwa, mu onwem emewo ka ariọtara ya Jehova; ubọchi nile ọ nādi ndu ya onwe-ya bu onye ariọtaworo nye Jehova. Ilai we kpọ isi ala nye Jehova n'ebe ahu.