Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 24:12 - Bible Nso

12 Ọ si, Jehova, bú Chineke nke onye-nwem Abraham, biko, me ka o zutem taa, bú ihe m'nāchọ, mekwara onye-nwem Abraham ebere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Mgbe ahụ, o kpere ekpere sị, “Onyenwe anyị, Chineke nke nna m ukwu Ebraham, mee ka ihe gaara m nke ọma taa. Gosi nna m ukwu Ebraham obi ebere gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 24:12
29 Iomraidhean Croise  

Mb͕e ihe ndia gasiri, okwu Jehova ruru Abram nti n'ọhù, si, Atula egwu, Abram: Mu onwem bu ọta diri gi, ugwọ-ọlu-gi riri nne nke-uku.


Nwoke ahu nēlegide ya anya, nāb͕a nkiti, imara ma Jehova mereri ka ije-ya ga nke-ọma, ma-ọbu na O meghi.


si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke onye-nwem Abraham, bu, Onye nārapughi ebere-Ya na ezi-okwu-Ya n'ebe onye-nwem nọ: mu onwem, n'uzọ ka Jehova duworom rue ulo umu-nne onye-nwem.


M'we bia ta rue isi-iyi ahu, si, Jehova, bú Chineke nke onye-nwem Abraham, biko, ọ buru na I nēme ijem nke mu onwem nēje ka ọ ga nke-ọma:


M'we rube isi, kpọ isi ala nye Jehova, gọzie Jehova, bú Chineke nke onye-nwem Abraham, Onye durumri n'uzọ ezi-okwu ilutara nwa onye-nwem nwa nwa-nne-ya nwoke na nwunye.


Jehova we me ka ọ hu Ya anya n'abali ahu, si, Mu onwem bu Chineke nke Abraham nna-gi: atula egwu, n'ihi na Mu na gi nọ, M'gāgọzi kwa gi, me ka nkpuru-gi ba uba n'ihi Abraham, bú orùm.


i gēbuga-kwa-ra nna-gi, ka ọ we rie, ka ọ we gọzie gi tutu ọnwu-ya.


Aisak we si nwa-ya, Ì si kwa aṅa me ngwa ichọta ya, nwam? Ọ si, N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, mere ka o zutem.


Ma, le, Jehova nēguzo n'elu ya, si, Mu onwem bu Jehova, Chineke nke Abraham nna-gi, na Chineke nke Aisak' ala nke gi onwe-gi nēdina n'elu ya, gi ka M'gēnye ya, nye kwa nkpuru-gi;


Ọ buru na Chineke nke nnam, bú Chineke nke Abraham, na Oké Egwù nke Aisak, anọghi n'akukum, n'ezie ub͕u a n'aka efu ka i gēzilagawomri. Nweda-n'alam na ndọb͕u m'ji akam abua nādọb͕u onwem n'ọlu ka Chineke huworo, Ọ̀ we bara gi nba n'abali nyahuru.


ekwe-sighm ebere nile, na ezi-okwu nile, nke I meworo orù-Gi: n'ihi na nkpa-n'akam ka m'were gabiga Jọdan nka; ma ub͕u a aghọwom ọmuma-ulo-ikwū abua.


Jekob we si, Chineke nke nnam Abraham, na Chineke nke nnam Aisak, Jehova, Nke nāsim, Laghachi n'ala-gi, laghachikuru umu-nna-gi, M'gēme kwa gi nma:


Chineke Nke puru ime ihe nile, Ya nye kwa unu obi-ebere n'iru nwoke ahu, ka ọ we zitere unu nwa-nne-unu nke-ọzọ na Benjamin. Ma mu onwem, ọ buru na ab͕abaram aka umu, ab͕abawom aka umu.


O rue, na mb͕e nsure onyinye-inata-iru-ọma, na Elaija, bú onye-amuma, biaruru nso, si, Jehova, bú Chineke Abraham na Aisak na Israel, ka amara ta na Gi onwe-gi bu Chineke n'Israel, na mu onwem bu kwa orù-Gi, na ọ bu kwa n'okwu-Gi ka m'meworo ihe nile ndia.


O we chiri uwe-nwuda Elaija, nke danariri ya, o we tie miri, si, Òle ebe Jehova nọ, bú Chineke Elaija? Ya onwe-ya kwa, o we tie miri, ewe kera ya otù uzọ ga n'otù akuku, otù uzọ ga n'akuku ọzọ; Elaisha we gabiga.


Biko, Onye-nwe-ayi, biko, ka nti-Gi nāṅa nti n'ekpere orù-Gi, na n'ekpere ndi-orù-Gi, ndi ọ nātọ utọ itu egwu aha-Gi: biko, me kwa ka ihe nāgara orù-Gi nke-ọma ta, me ka enwe obi-ebere n'aru ya n'iru nwoke a. (Ma mu onwem buru eze obu-ihe-ọṅuṅu.)


Eze we sim, Ọ̀ bu gini kwa ka gi onwe-gi nāchọ? M'we kpere Chineke nke elu-igwe.


Biko, Jehova, zọputa, biko: Biko, Jehova, me ka ihe nāgara ayi nke-ọma, biko.


Riọnu aririọ bayere udo Jerusalem: Ndi nāhu gi n'anya gānọ n'udo.


Ọ buru na Jehova ewughi ulo, N'efu ka ha dọb͕uworo onwe-ha n'ọlu nime ya, bú ndi nēwu ya: Ọ buru na Jehova echeghi obodo, N'efu ka onye-nche muruworo anya.


Kpọre uzọ-gi ru Jehova aru; Tukwasi kwa Ya obi, Ya onwe-ya gēme kwa ya.


Chineke si-kwa-ra Moses ọzọ, Otú a ka i gāsi umu Israel, Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob, O zitewom n'ebe unu nọ: nka bu aham rue mb͕e ebighi-ebi, nka bu kwa ihe-nchetam rue ọb͕ọ nile.


Ọ si kwa, Mu onwem bu Chineke nke nna-gi, Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob. Moses we zobe iru-ya; n'ihi na ọ nātu egwu ilegide Chineke anya.


N'uzọ-gi nile mara Ya, Ya onwe-ya gēme kwa ka okporo-uzọ-gi nile zie ezi.


Mu onwem bu Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob? Chineke abughi Chineke nke ndi nwuru anwu, kama Ọ bu nke ndi di ndu.


Unu echeb͕ula onwe-unu n'ihe ọ bula; kama n'ihe nile ọ bula site n'ekpere na aririọ, ya na ekele, menu ka Chineke mara ihe nile unu nāriọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan