Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 24:10 - Bible Nso

10 Orù ahu we chiri kamel iri, nime kamel nile nke onye-nwe-ya, je; ezi ihe nile nke onye-nwe-ya di kwa n'aka-ya: o bilie, je Mesọpọtemia, rue obodo Nehoa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Emesịa, ohu a duuru ịnyịnya kamel iri nʼime ndị nna ya ukwu nwere pụọ. O sitekwara nʼaka nna ya ukwu were ihe ọma dị iche iche maka njem a, gawa Aram Naharaim, rute nʼobodo Nahọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 24:10
19 Iomraidhean Croise  

Tira di ndu ọgu arọ atọ na iri, mua Abram, na Nehoa, na Heran.


Abram na Nehoa we lutara onwe-ha nwunye; aha nwunye Abram bu Serai; aha nwunye Nehoa bu Milka, nwa-nwayi Heran, bú nna Milka na nna Iska.


Tira we chiri Abram, bú nwa-ya nwoke, na Lot, bú nwa-nwoke nke Heran, ya bu nwa nwa-ya, na Serai, bú nwunye nwa-ya, bú nwunye Abram nwa-ya nwoke; ha na ha we si n'Ua nke ndi Kaldea pua, ije ala Kenean; ha biarue Heran, biri n'ebe ahu.


Ubọchi nile nke Tira we buru ọgu arọ iri na arọ ise: Tira we nwua nime Heran.


O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na egosiri Abraham, si, Le, Milka, ya onwe-ya amuwo-kwa-ra nwa-nne-gi nwoke, bú Nehoa, umu-ndikom;


Abraham we si orù-ya, bú okenye nke ulo-ya, onye nāchi ihe nile o nwere, Biko, tiye aka-gi n'okpuru apata-ukwum:


O rue, mb͕e camel ṅujusiri miri, na nwoke ahu were nb͕a-aka ọla-edo, nke ọtùtù-ya bu nkera shekel, na ọla-aka abua ib͕a n'aka-ya abua nke ọtùtù-ha bu shekel ọla-edo iri;


Orù ahu we chiputa ihe ọla-ọcha, na ihe ọla-edo, na uwe, nye Rebeka: ihe di iche iche nke di oké ọnu-ahia ka ọ nyekwara nwa-nne-ya nwoke na nne-ya.


Ma ub͕u a, nwam, ge nti n'olum; bilie, b͕akuru Leban, bú nwa-nnem nwoke, rue Heran;


Jekob we zọlie ukwu-ya, jerue ala umu Iru-anyanwu.


Ọ hu, ma, le, olùlù-miri n'ọhia, ma, le, n'ebe ahu ìgwè ewu na aturu atọ nāmakpu n'akuku ya; n'ihi na ọ bu n'olùlù-miri ahu ka ha nēme ka ìgwè aturu-ha ṅua: nkume di kwa uku nke di n'elu ọnu olùlù-miri ahu.


Umu Amon we hu na ha emewo onwe-ha ka ha nēsi Devid ísì ọjọ, Hanun na umu Amon we ziga nnù talent ọla-ọcha abua na ọgu iri igotara onwe-ha ub͕ọ-ala na ndi-inyinya site na Mesọpọtemia, site kwa na Siria Meaka, site kwa na Zoba.


Ndi Patia na ndi Midia na ndi Ilam, na ndi bi na Mesọ-pọtemia, ndi bi kwa nime Judia na Kapa-dọsia, nime Pọntọs na Esia,


n'ihi na ha ejighi achicha na miri bia n'iru unu n'uzọ, mb͕e unu siri n'Ijipt puta; na n'ihi na ha gotara Belam nwa Beoa imegide gi site na Petoa nke Mesọpọtemia, ikọcha gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan