Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 23:4 - Bible Nso

4 Ọbìa na onye-nnọdu ka m'bu n'etiti unu: nyenum ihe-onwunwe, bú ala-ílì, n'etiti unu, ka m'we lìpu ya n'anyam, bú onye-nkem nwuru anwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 “Abụ m ọbịa na onye obodo ọzọ nʼetiti unu. Resinụ m ala m ji eme ebe olili nʼebe a, ka m nwee ike lie onye m nwụrụ anwụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 23:4
21 Iomraidhean Croise  

M'gēnye kwa gi, nye kwa nkpuru-gi gānọchi gi, ala ọnọdu-ọbìa-gi nile, bú ala Kenean nile, ka ọ buru ihe-onwunwe ebighi-ebi; M'gābu-kwa-ra ha Chineke.


Umu Het we za Abraham, si ya,


n'ọsusọ iru-gi ka i gēri nri, rue mb͕e i gālata n'ala; n'ihi na esiri na ya weputa gi; n'ihi na ájá ka i bu, ọ bu kwa ájá ka i gālata.


Jekob we si Fero, Ubọchi arọ nke ọnọdu-ọbìam nile di ọgu arọ isi na iri: ha di ole-na-ole, jọ kwa njọ, bú ubọchi arọ ndum, ha erughi kwa ubọchi arọ ndu nke nnam-hà n'ubọchi ọnọdu-ọbia-ha.


n'ọb͕à nke di n'ọhia Makpila, nke di n'iru Mamre, n'ala Kenean, nke Abraham zutara, ya na ọhia ahu, n'aka Efron onye Het, ka ọ buru ihe-onwunwe nke gābu ala-ílì:


umu-ya ndikom we bubata ya n'ala Kenean, lìe ya n'ọb͕a nke ọhia Makpila, nke Abraham zutara, ya na ọhia, ka ọ buru ihe-onwunwe nke gābu ala-ílì, n'aka Efron onye-Het, n'iru Mamre.


N'ihi na ndi-ọbìa ka ayi bu n'iru Gi, na ndi-nnọdu, dika nna-ayi-hà nile: ubọchi nile ayi n'elu uwa di ka onyinyo, olile-anya adighi kwa.


N'ihi na amawom na ọ bu ọnwu ka I gēmem ka m'chigharikuru, Ru kwa ulo nzute nke diri ihe nile di ndu.


Ọbìa ka m'bu n'uwa: Ezonarilam ihe nile I nyere n'iwu.


Nuru ekperem, Jehova, ṅa kwa nti ntikum; Ab͕ala nkiti n'anya-mirim: N'ihi na ọbìa ka m'bu n'ebe I nọ, Abum onye-nnọdu, dika nnam-hà nile.


Nwanyi ahu we mua nwa-nwoke, Moses we kpọ aha-ya Giashom: n'ihi na ọ siri, Ọbìa ka m'bu-woro n'ala ọzọ.


ọzọ, ha gātu egwu ihe di elu, ihe-ujọ di iche iche gādi kwa n'uzọ; osisi almond gāb͕ọwa kwa okoko-ya, ukpala gāghọ kwa ibu, ọchichọ gāgwu kwa: n'ihi na madu nāla n'ulo ebighi-ebi ya, ndi nēti aka n'obi ewe jegharia n'amá buruburu:


ájá ewe laghachi n'ala dika o si diri, mọ alaghachikuru kwa Chineke Onye nyere ya.


Ọ buru na nwoke amuta ọgu umu ise, di kwa ndu ọtutu arọ, ubọchi nke arọ-ya ewe ba uba, ma afọ adighi-eju nkpuru-obi-ya n'ezi ihe, ọzọ kwa, ọ dighi olìlì diri ya; asiwom, na nwa amukworo amukwo di nma kari ya:


Agaghi-ere ala ahu rue mb͕e ọ gādiru n'ihi na Mu nwe ala ahu: n'ihi na ndi-ọbìa na ndi-nnọdu ka unu bu n'alam.


ewe būru ha gabiga n'ofè rue Shekem, tọb͕ọ ha n'ílì ahu nke Abraham were ọnu-ahia n'ọla-ọcha go n'aka umu Hemoa nime Shekem.


ma O nyeghi ya ala-nketa nime ya, é-è, Ọ nyeghi ya ebe izọkwasi ukwu-ya: O we kwe nkwa na O gēwere ya nye ya, na nkpuru-ya soro ya n'azu, ka ọ buru ihe ha nwere, mb͕e ọ kādighi nwa ọ muru.


Okwukwe ka o ji biri dika ọbìa n'ala nke ekwere ya-ri na nkwa, dika ala nābughi nke aka ya, ebe o biri n'ulo-ikwū, ya na Aisak na Jekob, ndi soro ya nēketakọ otù nkwa ahu:


Ndi m'huru n'anya, ariọm unu dika ndi-ọbìa na ndi nọ dika ọbìa, ka unu ghara ime ihe ọjọ di iche iche nāgu anu-aru, nke bu ihe nēbu agha imegide nkpuru-obi;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan