Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 22:8 - Bible Nso

8 Abraham we si, Chineke gāhuru Onwe-ya nwa-aturu iji chu aja-nsure-ọku, nwam: ha abua we yikọ je.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ebraham zara, “Nwa m, Chineke nʼonwe ya ga-eweta nwa atụrụ e ji achụ aja nsure ọkụ.” Ha abụọ gakwara nʼihu nʼije ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 22:8
14 Iomraidhean Croise  

Ọ̀ di ihe kariri Jehova ime? Na mb͕e akara àkà ka M'gēchigharikute gi, dika mb͕e a aka-nile, Sera gēnwe kwa nwa-nwoke.


Abraham we kpọ aha ebe ahu Jehova-Jaire: dika anāsi rue taa, N'ugwu nke Jehova ka agāhu ya.


Aisak we gwa Abraham, bú nna-ya, okwu, si, Nnam; ọ si, Lekwam, nwam. Ọ si, Le, ọku na nkú: ma òle ebe nwa-aturu iji chu aja-nsure-ọku di?


Ha biarue ebe ahu nke Chineke siri ya-ri je; Abraham we wue ebe-ichu-aja n'ebe ahu, do nkú ahu n'usoro, ke Aisak, bú nwa-ya nwoke, ab͕ú, tukwasi ya n'elu ebe-ichu-àjà, n'elu nku.


Elaija we si ya, Biko, nọdu n'ebe a; n'ihi na Jehova ezigawom ijeru Jọdan. Ọ si, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, m'gaghi-arapu gi ma-ọli. Ha abua we je.


Amazaia we si onye nke Chineke ahu, Ma gini ka ayi gēme bayere ọgu talent ise ahu nke m'nyeworo usu ndi nāpunara madu ihe nke Israel? Onye nke Chineke we si, Jehova nwere ihe inye gi nke bara uba kari.


Ma Jisus lere ha anya, si ha, N'ebe madu nọ nka bu ihe anāpughi ime; ma apuru ime ihe nile n'ebe Chineke nọ.


N'echi-ya ọ hu Jisus ka Ọ nābiakute ya, o we si, Le, Nwa-aturu Chineke, Nke nēbupu nmehie nke uwa!


o we le Jisus anya ka Ọ nējeghari, ọ si, Le, Nwa-aturu Chineke!


Ndi nile ndi bi n'elu uwa gākpọ kwa isi ala nye ya, onye ọ bula anēdeghi aha-ya n'akwukwọ nke ndu nke Nwa-aturu ahu Onye eb͕uworo site n'oge itọ ntọ-ala nke uwa.


anurum ka ha were oké olu nāsi, O kwesiri, bú Nwa-aturu ahu Nke eb͕uworo eb͕u, inata ike nile, na àkù, na amam-ihe, na ume, na nsọpuru, na otuto, na ngọzi.


M'we hu Nwa-aturu ka O nēguzo n'etiti oche-eze ahu na ihe anọ ahu nke di ndu, guzo kwa n'etiti ndi-okenye ahu, dika agāsi na eb͕uru Ya-ri, O nwe-kwa-ra mpi asa, na anya asa, nke bu Mọ asa ahu nke Chineke, bú nke ezigaworo ha n'uwa nile.


M'we si ya, Onye-nwem, gi onwe-gi matara. O we sim, Ndia bu ndi nēsi n'oké nkpab͕u ahu puta, ha sa-kwa-ra uwe-nwuda-ha, me kwa ka ha di ọcha nime ọbara Nwa-aturu ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan