Abraham we bilie n'isi-ututu, jikwa inyinya-ibu-ya, chiri madu abua nime umu-okorọbia-ya tiyere onwe-ya, na Aisak, bú nwa-ya nwoke; ọ kpọwa nkú nke àjà-nsure-ọku, bilie, je ebe ahu nke Chineke siri ya-ri je.
Abraham we si umu-okorọbia-ya, Nọdunu ebe a n'onwe-unu, unu na inyinya-ibu, ma mu onwem na nwa-okoro a gēje ebe ahu; ayi gākpọ kwa isi ala, chigharikute unu.
Jeghachi, si Hezekaia, bú onye-ndú ndim, Otú a ka Jehova, bú Chineke Devid nna-gi, siri, Anuwom ekpere-gi, ahuwom anya-miri-gi: le, M'nēme ka aru-gi di ike: n'ubochi nke-atọ i gārigoru ulo Jehova.
O rue, n'ubọchi nke-atọ, na Esta yiri uwe ala-eze ya, we guzo n'ogige di ime-ime nke ulo eze, na ncherita-iru ulo eze: ma eze nānọkwasi n'oche-eze ala-eze ya n'ulo ala-eze ya, na ncherita-iru ọnu-uzọ ulo ahu.
Ha si, Chineke nke ndi-Hibru ezutewo ayi: biko, ka ayi je ije nke ubọchi atọ n'ọzara, chuara Jehova, bu Chineke-ayi, aja: ka Ọ we ghara iwere ajọ ọria nēfe efe, ma-ọbu mma-agha, zute ayi.
onye ahu gēwere ya wepu nmehie-ya n'ubọchi nke-atọ, n'ubọchi nke-asa ọ gādi kwa ọcha: ma ọ buru na o wepughi nmehie-ya n'ubọchi nke-atọ, ọ gaghi-adi kwa ọcha n'ubọchi nke-asa.
onye ahu nke di ọcha gēfesa kwa onye ahu ruru árú n'ubọchi nke-atọ, na n'ubọchi nke-asa: ọ gēwepu kwa nmehie-ya n'ubọchi nke-asa; ọ gāsu kwa uwe-ya, sa kwa aru-ya na miri, di ọcha n'anyasi.
Ma unu onwe-unu, manu ulo-kwū-unu n'azu ọmuma-ulo-ikwū ubọchi asa: onye ọ bula nke b͕uworo madu, na onye ọ bula nke metuworo onye eb͕uru eb͕u aru, wepunu nmehie n'aru-unu n'ubọchi nke-atọ na n'ubọchi nke-asa, unu onwe-unu na ndi unu dọtaworo n'agha.
O we si ha, Ganu, si nkita-ọhia ahu, Le, anamachupu ndi-mọ ọjọ, nāluzu kwa ọlu ime ka aru di madu ike ta na echi, n'ubọchi nke-atọ emekwam ka M'zu okè.
Gabiganu n'etiti ọmuma-ulo-ikwū, nye ndi Israel iwu, si, Doziere onwe-unu ihe unu gēri n'uzọ; n'ihi na ọ fọduru ubọchi atọ unu ewe gabiga Jọdan nka, ibà nime inweta ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēnye unu inweta ya.