Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 22:23 - Bible Nso

23 Betuel we mua Rebeka: madu asatọ ndia ka Milka muru nye Nehoa, bú nwa-nne Abraham.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Betuel mụrụ Ribeka. Milka mụtaara Nahọ, nwanne Ebraham ụmụ ndị ikom asatọ ndị a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 22:23
13 Iomraidhean Croise  

Abram na Nehoa we lutara onwe-ha nwunye; aha nwunye Abram bu Serai; aha nwunye Nehoa bu Milka, nwa-nwayi Heran, bú nna Milka na nna Iska.


na Kesed, na Hazo, na Pildash, na Jidlaf, na Betuel.


Iko-ya nwayi, onye aha-ya bu Reuma, ya onwe-ya mu-kwa-ra Tiba, na Gaham, na Tahash, na Meaka.


O rue na, tutu o kwusia okwu, le, Rebeka nāputa, bú nwayi amuru nye Betuel nwa-nwoke Milka, bú nwunye Nehoa, nwa-nne Abraham, ite-ya di kwa n'ubu-ya.


Nwayi ahu we si ya, Nwa Betuel ka m'bu, bú nwa Milka, nke ọ muru nye Nehoa.


M'we jua ya, si, Nwa ònye ka i bu? Ọ si, Nwa Betuel ka m'bu, bú nwa Nehoa, onye Milka muru nye ya: m'we tiye nb͕a-aka ahu n'imi-ya, na ọla-aka abua ahu n'aka-ya abua.


Le, Rebeka nọ n'iru gi, kuru ya, la, ka ọ ghọrọ nwa onye-nwe-gi nwunye, dika Jehova kwuworo.


Ha we gọzie Rebeka, si ya, Nwa-nne-ayi, gi onwe-gi ghọ nnù kwuru nnù madu, ọzọ, ka nkpuru-gi nweta ọnu-uzọ-ama nke ndi nākpọ ha asì.


Aisak we me ka Rebeka bata n'ulo-ikwū Sera, bú nne-ya, o we kuru Rebeka, o we ghọ nwunye-ya; Aisak we hu ya n'anya: ewe kasie Aisak obi ka nne-ya nwusiri.


Aisak b͕ara ọgu arọ abua mb͕e ọ lutara Rebeka na nwunye, bú nwa-nwayi Betuel onye Siria nke Padan-eram, nwa-nne-nwayi Leban onye Siria.


Bilie, je Padan-eram, rue ulo Betuel, bú nna nne-gi; si n'ebe ahu lutara onwe-gi nwunye sitere n'umu-ndinyom Leban, bú nwa-nne-nwoke nne-gi.


Aisak we zipu Jekob: ọ je Padan-eram, jekuru Leban, nwa Betuel onye Siria, bú nwa-nne-nwoke Rebeka, nne Jekob na Isọ.


Ma ọ bughi nání nka; kama Rebeka kwa, mb͕e ọ tusiri ime site n'otù onye, bú Aisak nna-ayi-


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan