Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 21:9 - Bible Nso

9 Sera we hu nwa-nwoke Hega, bú nwayi Ijipt, nke ọ mururi Abraham, ka ọ nāchì ọchì nke-uku.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ma mgbe Sera hụrụ na nwa nwoke ahụ Hega onye Ijipt mụtaara Ebraham nọ na-akwa emo,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 21:9
19 Iomraidhean Croise  

Ma Serai, bú nwunye Abram, amughi nwa nye ya: ma ọ nwere otù nwayi nējere ya ozi, bú onye Ijipt, onye aha-ya bu Hega.


Hega we muara Abram nwa-nwoke: Abram we kpọ aha nwa-ya nwoke, nke Hega muru, Ishmael.


Ishmael kwa, anurum olu-gi bayere ya: le, agọziwom ya, M'gēme ka ọ mua ọmùmù, M'gēme kwa ka ọ ba uba nke-uku nke-uku; ndi-isi iri na abua ka ọ gāmu, M'gēme kwa ya ka ọ ghọ mba uku.


Nwa ahu we tó etó, eme ka ọ rapu ara: Abraham we me oké oriri di uku n'ubọchi emere ka Aisak rapu ara.


Ndi-ọb͕a-ọsọ ahu we nāgabiga site n'obodo rue obodo n'ala Efraim na Manase, we rue Zebulun: ha we nāchì ha ọchì, lelì kwa ha anya.


ha we nēme ndi-ozi Chineke ka ha buru ihe-ọchì, ha nēlelì kwa okwu-Ya anya, nēme kwa onwe-ha ndi-aghughọ n'ebe ndi-amuma-Ya nọ, rue mb͕e ọnuma Jehova lara elu imegide ndi-Ya, rue mb͕e ngwọta nādighi.


Ma ub͕u a ha achìwom ọchì, bú ndi bu nwata karim, Ndi m'juru ido ndi bu nna-ha n'etiti nkita nke ìgwè ewu na aturu nkem.


Ma mu onwem bu idide, ọ bughi kwa madu ka m'bu; Abum ihe-ita-uta nke mmadu, na onye ndim neleda anya.


Dika asi na eji ihe gwepia ọkpukpum nile, ndi nākpab͕um nātam uta; Mb͕e ha nāsin ogologo ubọchi nile, Òle ebe Chineke-gi nọ?


Ọbuná nwata nēme ka amata ya site n'omume-ya nile, Ma ọlu-ya di ọcha, ma o zi-kwa-ra ezi.


Chupu onye nākwa emò, ise-okwu gāpu kwa; E, iru-uka na nlelì gākwusi.


Jerusalem echetawo n'ubọchi nile nke nweda-n'ala-ya na nke nwaghari-ya nile Ihe nile ya anāchọsi ike nke diri site n'ubọchi nile nke mb͕e ochie: Mb͕e ndi-ya dabàra n'aka onye-nkpab͕u, ma ọ dighi onye nēyere ya aka, Ndi-nkpab͕u huru ya, ha chìri nkwusi-ya nile ọchì.


N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, na Abraham nwere umu-ndikom abua, otù site n'orù-nwanyi ahu, otù site kwa na nwanyi ahu nke nwere onwe-ya.


Ma dika onye amuru n'uzọ anu-aru sob͕uru onye amuru n'uzọ Mọ Nsọ mb͕e ahu, ọbuná otú a ka ọ di ub͕u a.


ma ndi ọzọ ka anwara ọnwunwa nke ihe-ọchi na utari, e, tukwasi ihe ndia, nke ab͕u na ulo-nkpọrọ:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan