Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 21:8 - Bible Nso

8 Nwa ahu we tó etó, eme ka ọ rapu ara: Abraham we me oké oriri di uku n'ubọchi emere ka Aisak rapu ara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Nwata ahụ tokwara, ruo mgbe a kwụsịrị ya ara. Nʼụbọchị ahụ a kwụsịrị ya ara, Ebraham kpọrọ oriri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 21:8
16 Iomraidhean Croise  

O rugide ha nke-uku; ha we si n'ije-ha wezuga onwe-ha jekuru ya, ba n'ulo-ya; O we mere ha oké oriri, sie achicha ekoghi-eko, ha rie.


Ọ si kwa, Ònye gāsiwori Abraham, Sera gēnye umu ara? n'ihi na amuworom ya nwa-nwoke n'agadi-ya.


Sera we hu nwa-nwoke Hega, bú nwayi Ijipt, nke ọ mururi Abraham, ka ọ nāchì ọchì nke-uku.


Ọ we mere ha oké oriri, ha rie ṅu kwa.


Leban we chikọta ndi ebe ahu nile, me oké oriri.


O rue, n'ubọchi nke-atọ, nke bu ubọchi ncheta ọmumu Fero, na o mere oké oriri nye ndi-orù-ya nile: o welie isi onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu na isi onye-isi ndi-osi-ite n'etiti ndi-orù-ya.


Abnea we biakute Devid rue Hebron, ya na orú ndikom. Devid we mere Abnea, me-kwa-ra ndikom soro ya, oké oriri.


Solomon we teta, ma, le, ọ bu nrọ: o we bata na Jerusalem, guzo n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Onye-nwe-ayi, sure àjà-nsure-ọku, chua àjà-udo, mere ndi-orù-ya nile oké oriri.


n'arọ nke-atọ nke ọbubu-eze-ya, na o mere ọṅuṅu-manya-vine nye ndi-isi-ya na ndi-orù-ya; ndi bu dìnkpà nke Peasia na Midia, bú ndi-eze na ndi-isi nke ala nile anāchi achi, nọ n'iru ya:


N'ezie edoziwom nkpuru-obim me ka ọ dere du; Dika nwata nke emere ka ọ rapu ara si di n'aru nne-ya, Dika nwata nke emere ka ọ rapu ara, otú a ka nkpuru-obim di n'arum.


O we me ka Lo-ruhama rapu ara, o we turu ime, mua nwa-nwoke.


Nna-ya we ridakuru nwayi ahu: Samson we me oké oriri n'ebe ahu; n'ihi na otú a ka umu-okorọbia nēme.


Samson we si ha, Biko, ka m'luere unu ilu: ọ buru na unu egosim ya nke-ọma n'ubọchi asa nke oké oriri a, ọ buru na unu achọta ya, m'gēnye kwa unu orú uwe ákwà ọcha na iri na orú uwe nb͕anwe na iri:


Ma Hana arigoghi; n'ihi na ọ siri di-ya, rue mb͕e agēme ka nwata rapu ara, m'gēme kwa ka ọ bia, ka ewe hu ya anya n'iru Jehova, o we biri n'ebe ahu rue mb͕e ebighi-ebi.


Ma mb͕e o mere ka ọ rapu ara, o we kuru ya n'aka-ya rigo, chiri kwa oke-ehi atọ, na otù ephah utu ọka, na otù karama-akpukpọ manya-vine, we me ka ọ ba n'ulo Jehova na Shailo: nwata ahu bu nání nwata.


Abigail we biakute Nebal; ma, le, o nwere oké oriri n'ulo-ya, dika oké oriri eze; obi Nebal we di nma nime ya, ọ ṅubiga-kwa-ra manya okè nke-uku: Abigail we ghara igosi ya okwu ọ bula, okwu ntà ma-ọbu okwu uku, rue ìhè ututu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan