Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 21:7 - Bible Nso

7 Ọ si kwa, Ònye gāsiwori Abraham, Sera gēnye umu ara? n'ihi na amuworom ya nwa-nwoke n'agadi-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 O kwukwara sị, “Onye gaara agwa Ebraham sị ya na Sera ga-azụlite ụmụntakịrị. Ma otu ọ dị, amụtarala m ya nwa nwoke ugbu a o merela agadi.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 21:7
15 Iomraidhean Croise  

Abraham we da kpue iru-ya n'ala, chì kwa ọchì, si n'obi-ya, Ọ̀ bu onye b͕ara ọgu arọ ise ka agā-muru nwa? Sera kwa, nke b͕ara ọgu arọ anọ na iri, ọ̀ gāmu nwa?


Jehova we si Abraham, Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka Sera chiworo ọchì, si, Ọ̀ gābu ezi-okwu na m'gāmu nwa, mb͕e mu onwem ghọworo agadi?


Nwa ahu we tó etó, eme ka ọ rapu ara: Abraham we me oké oriri di uku n'ubọchi emere ka Aisak rapu ara.


Nwa-nne Tahpenes we muara ya Genubat, bú nwa-ya nwoke, onye Tahpenes mere ka ọ rapu ara n'etiti ulo Fero: Genubat we nọ n'ulo Fero n'etiti umu-ndikom Fero.


M'we bilie n'ututu inye nwam ara, ma, le, ọ nwuwo: m'we tule ya n'ututu, ma, le, ọ bughi nwam nke m'muru.


N'ihi na onye uku ka I bu, I nālu kwa oké ọlu di iche iche: Gi onwe-gi bu Chineke, nání Gi.


Ọ dighi onye di ka Gi n'etiti chi nile, Onye-nwe-ayi; Ọ dighi kwa ọlu di ka ọlu-Gi nile.


I gāsi kwa n'obi-gi, Ònye muru ndia nyem, ebe mu onwem bu onye ab͕abaworo aka umu, na nwanyi-àgà, na onye emeworo ka ọ je biri n'ala ọzọ, na onye ewezugara ewezuga? ma ndia, ònye mere ka ha toputa? Le, mu onwem fọduru, náním; ndia, òle ebe ha nọ?


Ònye nuworo ihe dika nka? ònye huworo ihe dika ndia? Ìme ala gēme ya n'otù ubọchi? àgāmu mba n'otù mb͕e? n'ihi na ime mere Zaion, ọ mu-kwa-ra umu-ya.


Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke ziri nnam ozi, si, Amutara gi nwa-nwoke; nēme ka ọ ṅuria ọṅu nke-uku.


N'ihi na ọb͕ub͕a-afa adighi megide Jekob, Iju-ase adighi kwa megide Israel: Na mb͕e ahu ka agēkwu okwu bayere Jekob, baye-kwa-ra Israel, si, Le ihe Chineke meworo!


ka ewe me ub͕u a ka ibu-isi nile na ike nile nke di n'ebe di n'elu-igwe mara ọtutu okpukpu amam-ihe Chineke di iche iche site n'aka nzukọ-Ya,


mb͕e ọ bula Ọ gabia ka ewe nye Ya otuto nime ndi nsọ Ya, ka ibobo-Ya we nwu kwa ihe nile n'aru nime ndi kwereri ekwe (n'ihi na ekwere àmà ayi b͕ara unu) n'ubọchi ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan