Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 21:2 - Bible Nso

2 Sera we turu ime, muara Abraham nwa-nwoke n'agadi-ya, na mb͕e ahu akara àkà nke Chineke kpayere Abraham uka bayere ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Sera tụụrụ ime, mụọra Ebraham nwa nwoke nʼoge o merela agadi. Ọ mụrụ ya nʼoge ahụ a kara aka Chineke kwere ya na nkwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 21:2
12 Iomraidhean Croise  

Chineke we si, Kama, Sera, bú nwunye-gi, gaje imuru gi nwa-nwoke; i gākpọ aha-ya Aisak: M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'ebe ọ nọ, ka ọ buru ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi nye nkpuru-ya gānọchi ya.


Ma ọb͕ub͕a-ndum ka M'gēme ka o guzosi ike n'ebe Aisak nọ, bú nke Sera gāmuru gi na mb͕e nka akara àkà gaeru.


Ọ si, Aghaghim ichigharikute gi dika mb͕e a n'arọ ọzọ; le kwa, Sera, bú nwunye-gi, gēnwe nwa-nwoke. Ma Sera nuru n'ọnu-uzọ ulo-ikwū, nke di n'azu ya.


Ọ̀ di ihe kariri Jehova ime? Na mb͕e akara àkà ka M'gēchigharikute gi, dika mb͕e a aka-nile, Sera gēnwe kwa nwa-nwoke.


Le kwa, Elizabet onye-ikwu-gi, ya onwe-ya aturuwo kwa ime nwa-nwoke n'agadi-ya: nke a bu kwa ọnwa nke-isi ya, bú onye anākpọ nwanyi-àgà.


O we nye ya ọb͕ub͕a-ndu nke obibì-úgwù: otú a Abraham we mua Aisak, we bì ya úgwù n'ubọchi nke-asatọ; Aisak we mua Jekob, Jekob we mua nna uku ayi iri na abua.


N'ihi na nka bu okwu nke nkwa, Dika oge a si di M'gābia, Sera gēnwe kwa nwa-nwoke.


N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, na Abraham nwere umu-ndikom abua, otù site n'orù-nwanyi ahu, otù site kwa na nwanyi ahu nke nwere onwe-ya.


Okwukwe ka Sera ji nara ike ọbuná imu nwa, ya onwe-ya, mb͕e ọ gasiri oge imu nwa, ebe ọ guru Ya n'Onye kwesiri ntukwasi-obi, bú Onye kwereri nkwa:


M'we si n'ofè Osimiri ahu kuru nna-unu, bú Abraham, me ka ọ nēje ije n'ala Kenean nile, M'we me ka nkpuru-ya ba uba, M'we nye ya Aisak.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan