Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 21:16 - Bible Nso

16 je, nọdu ala n'onwe-ya na ncherita-iru ya n'ebe di anya, dika ndi nāb͕a uta gāb͕aru; n'ihi na ọ siri, Ka m'ghara ilekwasi ọnwu nwam anya. Ọ we nọdu na ncherita-iru ya, welie olu-ya, kwa ákwá.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Hapụ ya gaa nọdụ ala nʼebe dịtụ anya, ihe dịka narị nzọ ụkwụ, nʼihi na o kwuru nʼobi ya sị, “Achọghị m ịhụ nwantakịrị nwoke a anya mgbe ọ na-anwụ.” Mgbe ọ nọdụrụ ebe ahụ, o bidoro ịkwa akwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 21:16
16 Iomraidhean Croise  

Miri we gwu na karama-akpukpọ ahu, ọ we tuda nwa ahu n'okpuru otù nime osisi ntà,


Isọ we si nna-ya, Ọ̀ bu nání otú ngọzi ka i nwere, nnam? gọziem, ọbuná mu onwem, nnam. Isọ we welie olu-ya, kwa ákwá.


Jekob we sutu Rechel ọnu, welie olu-ya, kwa ákwá.


N'ihi na m'gesi aṅa rigokuru nnam, ma nwa-okoro a esoghm rigo? ka m'we ghara ilekwasi ihe ọjọ ahu anya nke gāchọta nnam.


Nwayi ahu we si, Jehova, bú Chineke-gi, nādi ndu, Ọ dighi ob͕e achicha m'nwere ma-ọli, ma nání otù nju-aka utu ọka n'okpokoro, na nwantī manu n'ite: ma, le, anamachikọta nkú abua, ka m'we ba, were ya doziere onwem, dozi-kwa-ra nwam nwoke, ka ayi we rie ya, nwua.


Nwayi ahu nke nwere nwa di ndu we si eze, (n'ihi na afọ chighariri ya n'aru nwa-ya,) o we si, Biko, onye-nwem, nyenu ya nwa di ndu, unu eme-kwa-la ka ọ nwua ma-ọli. Ma nwayi nke-ọzọ nāsi, M'gaghi-enwe ya, i gaghi-enwe kwa ya; kpọwanu ya.


N'ihi na #m'gēsi aṅa pu inagide ya mb͕e m'huru ihe ọjọ nke nābiakwasi ndim? #m'gēsi kwa aṅa pu inagide ya mb͕e m'huru ila-n'iyì umu-nnam?


Nwanyi, ọ̀ gēchezọ nwa-ya nāṅu ara, we ghara inwe obi-ebere n'aru nwa afọ-ya? e, eleghi anya ndia gēchezọ, ma Mu onwem agaghi-echezọ gi.


Ada nke ndim, ke ákwà-nkpe n'úkwù-gi, turua onwe-gi na ntu: mere onwe-gi oruru-újú dika nke nwa-nwoke enwere nání ya, bú iti-aka-n'obi di ilu nke-uku; n'ihi na ọ bu na mberede ka onye nāpunara madu ihe gābiakwasi ayi.


M'gāb͕anwe kwa ememe nile unu ka ha ghọ iru-újú, na abù nile unu, ka ha ghọ abù-ákwá; M'gēme kwa ka ákwà-nkpe biakwasi n'úkwù nile, na isi-nkwọcha n'isi nile ọ bula; M'gēme kwa ya ka ọ di ka újú anēruru nwa-nwoke amuru nání ya, M'gēme kwa ka mb͕e ikpe-azu ya di ka ubọchi nēlu ilu.


M'gāwukwasi kwa n'ulo Devid na n'aru onye bi na Jerusalem, mọ nke amara na aririọ-amara nile; ha gēlegidekwam anya, bú Onye ha mapūworo amapú: ha gēti-kwa-ra ya aka n'obi, dika madu si eti-kwa-ra nwa-nwoke amuru nání ya aka n'obi, obi-ha gēlu kwa ilu bayere ya, dika onye obi-ya nēlu ilu bayere nwa o buru uzọ mu.


O we bilie, biakute nna-ya. Ma mb͕e ọ nọ n'ebe di anya ub͕u a, nna-ya huru ya, o we nwe ọmiko n'aru-ya, b͕a ọsọ, makua ya n'olu, sutu kwa ya ọnu nke-uku.


O rue, mb͕e onye-ozi Jehova gwasiri umu Israel nile okwu ndia, na ndi Israel weliri olu-ha, kwa ákwá.


Jehova me ka unu chọta izu-ike, nwayi ọ bula n>ulo di-ya. O we sutu ha ọnu; ha we welie olu-ha kwa /akw/a.


O rue, mb͕e Devid gwabìri Sọl okwu ndia, na Sọl siri, Ọ̀ bu olu-gi, bú nka, nwam Devid? Sọl we welie olu-ya, kwa ákwá.


Devid na ndi ya na ha nọ we welie olu-ha kwa ákwá, rue mb͕e ike nādighi ha n'aru ọzọ ikwa ákwá.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan