Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 19:9 - Bible Nso

9 Ha si, Pua n'uzọ. Ha si kwa, Otù onye a batara inọ dika ọbia, ọ we nēkpe ikpe nke ukwu: ub͕u a ayi gēme gi ihe kari ihe ayi gēme ha. Ha we rugide nwoke ahu, bú Lot, nke-uku, biarue nso itiwa ibo-uzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ha zara sị ya, “Pụọra anyị nʼụzọ. Mbịarambịa ka ị bụ! Leenụ mbịarambịa a! Ọ chọrọ ịbụ onye ikpe. Anyị mee gị ihe, ọ ga-ajọrọ gị njọ karịa ihe anyị ga-eme ha.” Ha nuru Lọt aka nughachi ya azụ, malite itiwa ọnụ ụzọ ụlọ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 19:9
21 Iomraidhean Croise  

Jehova we si, Le, ha bu otù ndi, ọ bu kwa otù asusu ka ha nile nwere; nka bu kwa ihe ha nāmalite ime: ub͕u a agaghi-eb͕ochiri ha ihe ọ bula nke ha nēzube ime.


Abram biri n'ala kenean, ma Lot biri n'obodo nke Buruburu-ala ahu, ropu ulo-ikwū-ya je rue Sọdọm.


Ọ si, Ònye mere gi ka i buru onye-isi na onye-ikpe n'ebe ayi nọ. Ọ̀ bu ib͕um ka gi onwe-gi nēkwu okwu-ya, dika i b͕uru onye Ijipt? Moses we tua egwu, si, N'ezie amawo okwu a.


Onye mara ihe nātu egwu, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya: Ma onye-nzuzu nēwebiga iwe ókè, we nātukwasi obi.


Ka nne-bear nke b͕ara aka umu-ya zute madu, Kari onye-nzuzu n'uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ.


Nkume di arọ́, ájá bu kwa ibú; Ma nkpasu-iwe nke onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ di arọ́ kari ha abua.


Nmalite okwu nile nke ọnu-ya bu nzuzu: nkwubì okwu-ọnu-ya bu kwa iwi-ara ọjọ.


Nka bu ihe ọjọ n'ihe nile anēme n'okpuru elu-igwe, na otù ndabà nādabàra madu nile: ọzọ kwa, obi umu madu juputara n'ihe ọjọ, iwi-ara di kwa n'obi-ha mb͕e ha nọ na ndu, ma emesia ha nālakuru ndi nwuru anwu.


ndi nāsi, Guzoro onwe-gi iche, abiarula nsom, n'ihi na edowom i ihe nsọ: ndia bu anwuru-ọku n'imim, ọku nke nēre ogologo ubọchi nile.


Ewe b͕ochie oké miri-ozuzo nile, miri-ozuzo ikpe-azu adighi kwa; ma egedege-iru nke nwayi nākwa iko ka i nwere, i juru ka etiye gi n'ọnọdu-ihere.


Ọ̀ di ihere mere ha mb͕e ha mere ihe-árú? é-è, ihere adighi-eme ha ma-ọli, ọ dighi kwa itiye-n'ọnọdu-ihere ha mara: n'ihi nka ha gāda n'etiti ndi nāda ada: na mb͕e M'letara ha ha gāsu ngọngọ, ka Jehova siri.


ọ̀ di ihere mere ha megbe ha mere ihe-árú? é-è, ihere adighi-eme ha ma-ọli, ọ dighi kwa itiye-n'ọnọdu-ihere ha mara: n'ihi nka ha gāda n'etiti ndi nāda ada: na mb͕e eletara ha ha gāsu ngọngọ, ka Jehova siri.


Le, nka bu ajọ omume nke Sọdọm, bú nwa-nne-gi nwanyi; npako, na afọ ojuju nri, na udo nke inọ-jū, diri ya na umu-ya ndinyom; ma o meghi ka aka nke onye ewedara n'ala na ob͕eye di ike.


Unu enyela nkita ihe di nsọ, unu atuda-kwa-la pearl-unu n'iru ezì, ka ha ghara izọkwasi ha n'ukwu-ha ma eleghi anya, we chigharia, dọka unu.


Onye Filistia ahu we si Devid, Biakutem, ka m'were kwa anu-aru-gi nye anu-ufe nke elu-igwe na anumanu nke ọhia.


Ma ọ buru na nwoke ahu asi ya, Ha aghaghi isure abuba ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ dika anēme ta, emesia nara n'onwe-gi dika nkpuru-obi-gi si achọ; ọ gāsi kwa, É-è, kama ub͕u a ka i gēnyem: ma ọ buru na i nyeghm, m'gānara ya n'ike.


Ma ub͕u a mara hu kwa ihe i gēme; n'ihi na ezubesiri ihe ọjọ ike megide onye-nwe-ayi, megide kwa ulo-ya nile: ma ya onwe-ya bu nwoke jọb͕uru onwe-ya, nke madu nāpughi igwa ya okwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan