Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 19:25 - Bible Nso

25 O we kwatue obodo ndia, na Buruburu-ala ahu nile, na ndi nile bi n'obodo ahu nile, na ihe-opupú nke ala.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 Otu a ka o si kwatuo obodo ndị ahụ niile dị na mbara ala ahụ niile, na ndị niile bi nʼobodo ndị ahụ. O kwatukwara ihe niile na-epu nʼala.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 19:25
15 Iomraidhean Croise  

Lot we welie anya-ya abua, hu Gburugburu-ala nile nke Jọdan, na ala ahu nile bu ala miri nēdè nke-ọma, tupu Jehova ebibie Sọdọm na Gọmọra, dika ubi Jehova ab͕ara ogige, dika ala Ijipt, mb͕e i nēje Zoa.


Abram biri n'ala kenean, ma Lot biri n'obodo nke Buruburu-ala ahu, ropu ulo-ikwū-ya je rue Sọdọm.


Ndia nile jikọtara onwe-ha n'otù na ndagwurugwu Sidim (nke ahu bu Oké Osimiri Nnú).


Ala nke nāmi nkpuru ka ọ ghọ ala nnú nnú, Site n'ihe ọjọ nke ndi bi nime ya nēme.


Babilon, bú ihe mara nma nke ala-eze nile, ima-nma nke npako ndi Kaldea, ọ gādi ka mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra.


Ka nwoke ahu di kwa ka obodo nile nke Jehova kwaturu, ghara ichèghari: ya nu kwa iti-nkpu n'ututu, na iti-nkpu agha n'etiti-ehihie;


Ọzọ, n'aru ndi-amuma Jerusalem ka M'huworo ihe jọb͕uru onwe-ya; ha nākwa iko, nējeghari kwa n'okwu-ugha, ha emewo kwa ka aka ndi nēme ihe ọjọ di ike, ha we ghara isi, onye ọ bula n'ihe ọjọ ya, lata: ha nile aghọworom ihe di ka Sọdọm, ndi bi nime ya aghọwo-kwa-ram ihe di ka Gọmọra.


Dika nkwatu nke Sọdọm na Gọmọra na ab͕ata nile ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ dighi onye ọ bula gēbi n'ebe ahu, nwa madu ọ bula agaghi-anọ kwa dika ọbìa nime ya.


Dika mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra na ab͕ata nile ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); otú a ọ dighi onye ọ bula gēbi n'ebe ahu, nwa madu ọ bula agaghi-anọ kwa dika ọbìa nime ya.


Ajọ omume nke ada ndim we di uku kari nmehie Sọdọm, Nke akwaturu dika n'otù ntabi-anya, ma ọ dighi aka ọ bula dakwasiri ya.


Ha we di elu n'obi, me ihe-árú n'irum: M'we wezuga ha mb͕e M'huru ya.


Akwatuwom ufọdu n'etiti unu, dika mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra, unu we di ka ọlọkọ-ọku alọputara n'orire-ọku: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


N'ihi nka, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, puta), n'ezie Moab gādi ka Sọdọm, umu Amon gādi kwa ka Gọmọra, ihe-onwunwe nke akuba, na olùlù-nnú, na ebe tọb͕ọrọ n'efu rue mb͕e ebighi-ebi: ndim fọduru gāluta ihe-ha n'agha, ndi mbam fọduru gēketa kwa ha.


mb͕e ha nāhu kwa na ala-ya nile bu brimstone, na nnú, na orire-ọku, na adighi-agha ya nkpuru, na ọ dighi-eme kwa ka ihe pue, na ọ dighi kwa ihe-ọkukú ọ bula nētolite nime ya, dika nkwatu Sọdọm na Gọmọra na Adma na Zeboim, nke Jehova kwaturu n'iwe-Ya na n'ọnuma-Ya:


O we me ka obodo Sọdọm na Gọmọrra ghọ ntu, were kwa ikpù-iru ma ha ikpé, ebe O mere ha-ri ka ha buru ihe-ilere-anya nye ndi gaje ibu ndi nādighi-asọpuru Chineke;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan